Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 35 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Josiah kept Passover to our Father in Jerusalem; they slaughtered the Passover lamb on the fourteenth day of the first month. Josaya mere Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị na Jerusalem nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ. Ha gburu atụrụ Mmemme Ngabiga nʼụbọchị ahụ
2 He assigned priests their duties and encouraged them in service of our Father's house. O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha.
3 He told the Levites who taught all Israel and were holy to our Father: "Put the holy ark in the house Solomon son of David, king of Israel, built. You need no longer carry it on your shoulders. Now serve your Father and his people Israel. Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.
4 Prepare yourselves by your fathers' houses, by your divisions, by David king of Israel's written instructions, and his son Solomon's instructions. Kwadoonụ onwe unu nʼusoro ezinaụlọ unu nʼotu nʼotu, dịka ntụziaka ihe Devid, eze Izrel dere nʼakwụkwọ si dị, ya na nke Solomọn nwa ya si dịkwa.
5 Stand in the holy place by family groups of your lay brothers, one Levite division per group. “Werenụ ọnọdụ nʼebe nsọ unu na otu ndị Livayị, maka nkewa nke ezinaụlọ nna nna unu ha si dị, bụ ikwu ndị Izrel, ndị na-abụghị ndị nchụaja.
6 Slaughter the Passover lamb, dedicate yourselves, and prepare for your brothers, following the word of our Father through Moses." Gbuonụ atụrụ ngabiga ndị ahụ, doonụ onwe unu nsọ, doziekwaranụ ụmụnna unu ndị Izrel aja ha, ime dịka ihe Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si dị.”
7 Josiah gave the lay people 30,000 lambs and young goats, 3,000 bulls, for Passover offerings—for everyone present, from his own possessions. Josaya nyere ndị niile nọ nʼebe ahụ onyinye igwe ewu na atụrụ ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, nke ha ga-eji chụọ aja Mmemme Ngabiga. O nyekwara ha puku oke ehi atọ site nʼakụ eze.
8 His officials also gave willingly to the people, priests, and Levites. Hilkiah, Zechariah, and Jehiel, chief officers of our Father's house, gave the priests 2,600 Passover offerings and 300 bulls. Ndịisi ya nyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị onyinye afọ ofufu. Otu a kwa, Hilkaya na Zekaraya, na Jehiel, ndị na-elekọta ụlọnsọ Chineke nyere ndị nchụaja puku ewu na atụrụ abụọ na narị isii, nyekwa ha narị oke ehi atọ, maka iji chụọ aja Ngabiga.
9 Conaniah, with his brothers Shemaiah and Nethanel, and Hashabiah, Jeiel, and Jozabad, Levite leaders, gave the Levites 5,000 Passover offerings and 500 bulls. Ndị bụ ndị ndu nʼebo Livayị aha ha bụ Konanaya, na Shemaya, na Netanel, na nwanne ya Hashabaya, na Jeiel, na Jozabad, nyere ndị Livayị puku ewu na atụrụ ise, na narị oke ehi ise maka iji ha chụọ aja Ngabiga.
10 The service was set; priests stood at their posts, Levites by their divisions, as the king commanded. Mgbe e dozichara usoro ije ozi ahụ niile, ndị nchụaja weere ọnọdụ ha, ha na ndị Livayị nʼoke ọrụ ha nʼusoro dịka eze nyere nʼiwu.
11 They slaughtered the Passover lambs; priests sprinkled the blood passed to them, and Levites skinned them. Mgbe ahụ ndị Livayị gburu atụrụ ngabiga ahụ niile, were ọbara ha nye ndị nchụaja. Ha fesara ya nʼebe ịchụ aja mgbe ndị Livayị nọ na-agba anụ ndị ahụ akpụkpọ.
12 They set aside the burnt offerings, distributing them by family division among the common people, to offer to our Father as written in the book of Moses; likewise with the bulls. Ha kenyere ezinaụlọ ọbụla anụ ndị ahụ niile ka ha jiri nke ha ketara chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼusoro dịka e dere nʼime akwụkwọ Mosis. Otu a ka ha mekwara banyere ehi ndị ahụ.
13 They roasted the Passover lamb in fire as required, boiled the holy offerings in pots, kettles, and pans, and quickly brought them to all the common people. Otu a kwa, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, ha hụrụ anụ aja ngabiga ahụ nʼọkụ, sie aja ndị dị nsọ nʼite, buputa ha ngwangwa kee ha ndị mmadụ niile.
14 Afterward they prepared for themselves and the priests, since the priests, Aaron's sons, were busy offering burnt offerings and fat portions until night; so the Levites prepared for themselves and the priests, Aaron's sons. Emesịa, ha kwadooro onwe ha ihe, ma kwadokwara ndị nchụaja, nʼihi na ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn, nọọrị na-achụ aja nsure ọkụ na abụba anụ ruo abalị. Ya mere, ndị Livayị ji kwadoro onwe ha ma kwadokwara ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn ihe.
15 The singers, Asaph's sons, stood at their posts as David, Asaph, Heman, and Jeduthun the king's seer had commanded. The gatekeepers stayed at each gate; they had no need to leave their duty, for their fellow Levites prepared for them. Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha.
16 So all the service of our Father was arranged that day: to keep Passover and offer burnt offerings on the altar of our Father, by King Josiah's command. Ya mere, e doziri ofufe niile nke Onyenwe anyị nʼotu ụbọchị ahụ, maka ime Mmemme Ngabiga na ịchụ aja nsure ọkụ niile nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, dịka eze Josaya nyere nʼiwu.
17 The Israelites present kept Passover then, and the Feast of Unleavened Bread seven days. Ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ mere Mmemme Ngabiga nʼoge ahụ, meekwa mmemme achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa.
18 No Passover like it had been kept in Israel since Samuel the prophet's days; none of Israel's kings kept a Passover like Josiah's, with the priests, Levites, all Judah and Israel present, and Jerusalem's residents. E mebeghị Mmemme Ngabiga nʼụdị a nʼIzrel, site nʼụbọchị Samuel onye amụma, o nwebekwaghị eze Izrel ọbụla nke merela mmemme a dịka Josaya mere, ya na ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị Juda niile na ndị Izrel niile bụ ndị nọ nʼebe ahụ tinyere ndị Jerusalem.
19 This Passover was kept in the eighteenth year of Josiah's reign. Ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, ka e mere Mmemme Ngabiga a.
20 After all this, once Josiah had prepared the temple, Egypt's king Neco marched up to fight at Carchemish on the Euphrates, and Josiah went out to meet him. Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha.
21 But Neco sent messengers to him, saying, "What do we have to do with each other, king of Judah? I'm not coming against you today, but against the house I'm at war with. God told me to hurry—stop opposing God, who is with me, or he'll destroy you." Ma Neko zipụrụ ndị ozi bịara zie Josaya ozi, sị ya, “Olee esemokwu dị ugbu a nʼetiti mụ na gị, gị eze Juda? Ọ bụghị ibuso gị agha ka m bịara, kama ọ bụ naanị ụlọ mụ na ha nọ nʼagha. Chineke sịrị m ka m mee ngwa; ya mere, egbochikwala Chineke onye nọnyeere m, ka ọ ghara iji iwe bibie gị.”
22 Josiah did not turn away from him, but disguised himself to fight him. He ignored Neco's words from the mouth of our Father, and went to fight in the plain of Megiddo. Ma Josaya esiteghị nʼebe ọ nọ chigharịa, kama o nwogharịrị onwe ya, ka a ghara ịmata onye ọ bụ, maka ịga buso ya agha. O geghịkwa ntị na okwu ahụ eze Neko kwuru nke si nʼaka Chineke bịa, kama ọ pụrụ ibuso ya agha nʼala Megido.
23 Archers shot King Josiah; he told his servants, "Get me out—I'm badly wounded." Ma mgbe ndị nʼagba ụta gbatara eze, bụ Josaya ụta, eze gwara ndị ozi ya sị, “Bupunụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.”
24 His servants moved him from the chariot to his second chariot and brought him to Jerusalem, where he died and was buried in his fathers' tombs. All Judah and Jerusalem mourned Josiah. Ya mere, ha sitere nʼụgbọ agha ya bulie ya bubanye ya nʼime ụgbọ agha ọzọ, bulata ya na Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ. E liri ya nʼili nna nna ya ha, ndị Juda na Jerusalem niile ruuru ya uju.
25 Jeremiah composed laments for Josiah, and to this day all the singers, men and women, sing laments for Josiah. This became a custom in Israel, and it is written in the Laments. Jeremaya bụụrụ Josaya abụ akwa, ruo taa ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ a iji na-echeta Josaya. Nke a ghọrọ omenaala nʼIzrel, e dekwara ya nʼakwụkwọ abụ akwa dị iche iche.
26 The rest of Josiah's acts, and his faithful deeds in keeping with what is written in our Father's law. Ihe ndị ọzọ niile Josaya mere, na ọrụ ebere niile ọ rụrụ nʼusoro ihe e dere nʼiwu Onyenwe anyị,
27 His acts, first to last, are written in the Book of the Kings of Israel and Judah. na akụkọ ndụ ya site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ, ka e depụtara nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]