Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 36 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The people of the land took Josiah's son Jehoahaz and made him king in Jerusalem in place of his father. Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz, nwa nwoke Josaya mee ya eze na Jerusalem, nʼọnọdụ nna ya.
2 Jehoahaz was twenty-three years old when he became king, and he reigned three months in Jerusalem. Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ.
3 Egypt's king deposed him at Jerusalem and fined the land about 7,500 pounds of silver and 75 pounds of gold. Eze Ijipt chụdara ya site nʼọchịchị na Jerusalem, kwagide ndị Juda ka ha tụọra ya ụtụ narị talenti ọlaọcha na otu talenti ọlaedo.
4 Egypt's king made his brother Eliakim king over Judah and Jerusalem, renaming him Jehoiakim; Neco took his brother Jehoahaz to Egypt. Eze Ijipt mere Eliakịm, otu nwanne Jehoahaz, eze ndị Juda na Jerusalem. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma Neko duuru Jehoahaz nwanne nwoke Eliakịm gaa Ijipt.
5 Jehoiakim was twenty-five when he became king; he reigned eleven years in Jerusalem, doing evil in our Father's eyes. Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke ya.
6 Nebuchadnezzar king of Babylon marched against him, bound him in bronze chains to take him to Babylon. Nebukadneza eze Babilọn busoro ya agha, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nʼihi i duru ya gaa Babilọn.
7 Nebuchadnezzar also took some of our Father's house articles to Babylon, putting them in his temple in Babylon. Nebukadneza bukọkwaara efere na iko ọlaedo dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, buru ha gaa buba ha nʼụlọeze ya dị na Babilọn.
8 The rest of Jehoiakim's acts, his detestable things, and the charges against him are written in the Book of Kings of Israel and Judah; his son Jehoiachin reigned in his place. Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim, na banyere ihe arụ niile o mere, na ihe niile a chọpụtara megide ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
9 Jehoiachin was eight when he became king; he reigned three months and ten days in Jerusalem, doing evil in our Father's eyes. Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị naanị ọnwa atọ na abalị iri na Jerusalem. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị.
10 In spring, King Nebuchadnezzar brought him to Babylon with the precious articles from our Father's house, making Zedekiah, Jehoiachin's relative, king over Judah and Jerusalem. Emesịa, nʼafọ nke ọzọ ya, Nebukadneza ziri ozi mee ka akpọrọ ya, na ọtụtụ ihe ndị dị oke ọnụahịa sitere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bulaa ha Babilọn nʼoge a. O mere nwanne nna Jehoiakin bụ Zedekaya, eze Juda na Jerusalem.
11 Zedekiah was twenty-one years old when he became king, and he reigned eleven years in Jerusalem. Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem.
12 He did evil in our Father's eyes, not humbling himself before Jeremiah the prophet, who spoke from our Father's mouth. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke ya, o wedaghị onwe ya ala nara ndụmọdụ Jeremaya bụ onye amụma, onye na-ekwu okwu nke Onyenwe anyị.
13 He also rebelled against King Nebuchadnezzar, who made him swear by our Father, stiffening his neck and hardening his heart, refusing to return to our Father, God of Israel. Ọzọkwa, o nupuru isi megide eze Nebukadneza, onye mere ka ọ ṅụọ iyi nʼaha Chineke. Ọ ghọrọ onye isiike, onye mechiri obi ya, jụ ichigharịkwute Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
14 All the leading priests and the people grew more and more unfaithful, matching all the nations' detestable practices, and made unclean the house our Father had made holy in Jerusalem. Nʼime ka ihe dị njọ karịa, mmadụ niile, tinyere ndị ndu nʼetiti ndị nchụaja, nọgidere bụrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, site nʼịgbaso omenaala rụrụ arụ nke mba niile gbara ha gburugburu. Ha merụrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke o doro nsọ nʼime Jerusalem.
15 Our Father, the God of their fathers, sent word repeatedly through his messengers, pitying his people and his dwelling place. Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, sitere nʼọnụ ndị amụma ya gwa ha okwu mgbe na mgbe, ịdọ ha aka na ntị. O mere nke a nʼihi na o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, na nʼebe ụlọnsọ ukwu ya dị.
16 But they mocked our Father's messengers, despised his words, mocked his prophets, until our Father's anger rose against his people, past remedy. Ma ha kwara ndị amụma Chineke ndị a emo, lelịa okwu Chineke ha wetara anya, chịa amụma ha buru ọchị, tutu ruo mgbe ha kpasuru ọnụma Onyenwe anyị megide ndị ya, ruo mgbe ihe ọbụla na-adịghịkwa nke pụrụ igbochi ngosipụta oke ọnụma a.
17 So he brought Chaldea's king against them, who killed their young men with the sword in their sanctuary, sparing no young man, virgin, elder, or aged. Our Father gave them all into his hand. Ya mere, o welitara eze Kaldịa imegide ha, bụ onye ji mma agha gbuchapụ ụmụ okorobịa ha nʼụlọ ebe nsọ ha. O nweghịkwa ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa, maọbụ ụmụ agbọghọ dị, ndị okenye maọbụ ndị nrịa nrịa. Chineke weere ha niile nyefee ha nʼaka Nebukadneza.
18 All the articles of our Father's house, great and small, the treasures of our Father's house and of the king and his officials—all he brought to Babylon. O sitere nʼụlọnsọ ukwu Chineke kpokọrọ ihe niile dị nʼime ya, ma ihe ukwu ma ihe nta, tinyere akụ niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, na nʼụlọeze, na nʼụlọ ndịisi ozi eze buru ha gaa Babilọn.
19 They burned the house of our Father, tore down Jerusalem's wall, burned all its palaces, destroyed everything valuable in it. Ha sunyere ụlọnsọ Chineke ọkụ, kwatukwa mgbidi Jerusalem. Ha sunyere ụlọeze niile ọkụ, mebikwaa ihe niile ndị bara uru dị nʼime ya.
20 He exiled the sword's survivors to Babylon; they served him and his sons until Persia's kingdom began to reign, Ha buuru ndị fọdụrụ, bụ ndị niile gbanarịrị mma agha, gaa Babilọn, ha ghọrọ ya, ghọkwara ụmụ ya ndị nọchiri anya ya, ndị ohu, tutu ruo mgbe ehiwere alaeze Peshịa.
21 to fulfill our Father's word through Jeremiah: until the land enjoyed its sabbaths, all its desolate days it rested, fulfilling seventy years. Ala ahụ nwere ụbọchị izuike niile kwesiri ya nʼebe o zuruoke, nʼoge niile nke ịtọgbọ nʼefu ya, o zuru ike, ruo mgbe iri afọ asaa ahụ zuru, nʼimezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma.
22 In Cyrus king of Persia's first year, to fulfill our Father's word through Jeremiah, our Father stirred Cyrus king of Persia's spirit to proclaim throughout all his kingdom, and to put it in writing: Ma nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,
23 Cyrus king of Persia says: "The LORD, God of heaven, gave me all earth's kingdoms and charged me to build him a house in Jerusalem, in Judah. Any of his people among you—may the LORD his God be with him—let him go up." “Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru: “ ‘Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa. O nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga, ka Onyenwe anyị Chineke ha nọnyekwara ha.’ ”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]