Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 34 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Josiah was eight years old when he became king, and he reigned thirty-one years in Jerusalem. Josaya gbara afọ asatọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị iri afọ atọ na otu na Jerusalem.
2 He did what was right in our Father's eyes and walked in the ways of David his father, not turning right or left. O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
3 In the eighth year of his reign, while still a boy, he began to seek our Father, the God of David his father. In the twelfth year he began to purge Judah and Jerusalem of the high places, Asherah poles, carved images, and cast metal images. Nʼafọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ okorobịa, o bidoro iji obi ya niile na-achọ Chineke nke nna ya Devid. Nʼafọ iri na abụọ nke ọchịchị ya, ọ malitere ime ka Juda na Jerusalem dị ọcha site nʼiwezuga ebe ịchụ aja niile dị elu, na ogidi Ashera niile, na arụsị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ niile.
4 In his presence they tore down the Baals' altars; he cut down the incense altars above them, shattered the Asherah poles, carved images, and cast images, ground them to dust, and scattered it over the graves of those who had sacrificed to them. Nʼihu ya o mere ka a kwatuo ebe ịchụ aja Baal nʼike. Ọ kụdara ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị nʼelu ebe ịchụ aja Baal ndị ahụ, tijisie ogidi Ashera niile, na arụsị na oyiyi niile. Ọ kụjasịrị ha niile, kpokọrọ ha ghasaa ha nʼelu ili ndị na-efe ha.
5 He burned the bones of the priests on their altars, and so he purged Judah and Jerusalem. Ọ kpọrọ ọkpụkpụ ndị nchụaja ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja arụsị ha, si otu a mee ka Juda na Jerusalem dị ọcha.
6 In the cities of Manasseh, Ephraim, and Simeon, as far as Naphtali, in their ruins all around. Nʼobodo ndị Manase, na Ifrem na Simiọn, ruo na Naftalị, na mkpọmkpọ ebe ha niile gburugburu.
7 He tore down the altars, crushed the Asherah poles and carved images to powder, and cut down all the incense altars throughout Israel. Then he returned to Jerusalem. O titụrụ ebe ịchụ aja nke arụsị niile na ogidi arụsị Ashera, gwepịa arụsị ndị a niile dịka ntụ. Otu a ka o mere nʼala Izrel niile tupu ọ laghachi Jerusalem.
8 In the eighteenth year of his reign, having cleansed the land and the house, he sent Shaphan son of Azaliah, Maaseiah the city governor, and Joah son of Joahaz the recorder to repair the house of our Father. Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, mgbe o mere ka ala ahụ na ụlọnsọ dị ọcha, o zigara Shefan nwa Azalaya, Maaseia onye na-achị obodo, na Joa nwa Joahaz, onye na-edekọ akụkọ, ka ha wuzie ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ Chineke ya.
9 They came to Hilkiah the high priest and handed over the money brought into the house of our Father, which the Levites who guarded the gates had collected from Manasseh, Ephraim, and all the remnant of Israel, from all Judah and Benjamin, and the residents of Jerusalem. Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem.
10 They gave it to the workers overseeing the house of our Father, and the workers in the house of our Father used it to repair and restore it. Mgbe ahụ, ha nyefere ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ndị ikom a kwụrụ ndị ọrụ rụziri ma mezie ụlọnsọ ahụ ụgwọ.
11 They paid the carpenters and builders to buy cut stone, and timber for the joists and beams of the buildings the kings of Judah had let fall to ruin. Ha nyekwara ndị ọkpọ ǹtu na ndị na-ewu ụlọ ego iji zụta nkume a wara awa, osisi iji mee ihe njikọta na osisi ịkwado ụlọ, maka iji rụzie ụlọ a nke ndị eze Juda hapụrụ ka ọ dakasịa.
12 The men worked faithfully. Over them, directing the work, were Jahath and Obadiah, Levites of Merari's sons, and Zechariah and Meshullam of the Kohathites; and the Levites, all skilled musicians, Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche
13 were over the laborers, directing all the workers task by task. Some Levites were scribes, officials, and gatekeepers. ka e mere ndị nlekọta ndị na-ebu ibu. Ha lekọtakwara ndị niile rụrụ ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ nʼime ndị Livayị ndị a bụ ndị ode akwụkwọ na ndị na-edekọ ihe, na ndị na-eche ọnụ ụzọ nche.
14 As they brought out the money brought into the house of our Father, Hilkiah the priest found the Book of the Law of our Father, given through Moses. Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, Hilkaya onye nchụaja chọtara akwụkwọ Iwu Onyenwe anyị, bụ nke o nyere site nʼaka Mosis.
15 Hilkiah told Shaphan the scribe, "I've found the Book of the Law in our Father's house," and gave it to Shaphan. Hilkaya sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.” O nyere ya Shefan.
16 Shaphan brought the king the book and reported, "Your servants are doing everything put in their care. Mgbe ahụ, Shefan buuru akwụkwọ ahụ wegara ya eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị na-eje ozi ha dịka ihe niile i tinyere ha nʼaka si dị.
17 They emptied out the money found in the house of our Father and handed it to the overseers and workmen." Ha enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼaka ndị nlekọta ọrụ, na ndị ọrụ.”
18 Shaphan the scribe told the king, "Hilkiah the priest gave me a book," and read it to the king. Emesịa, Shefan ode akwụkwọ gwara eze okwu ọzọ sị ya, “O nwere akwụkwọ Hilkaya nyere m.” Shefan wepụtara ya gụọ ya na ntị eze.
19 When the king heard the words of the Law, he tore his clothes. Mgbe eze nụrụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya.
20 The king commanded Hilkiah, Ahikam son of Shaphan, Abdon son of Micah, Shaphan the scribe, and Asaiah the king's servant: O nyere Hilkaya, Ahikam nwa Shefan, Abdon nwa Maịka, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,
21 "Go, ask our Father for me and those left in Israel and Judah about the words of the book that was found. Great is his anger poured out on us, because our ancestors did not keep our Father's word, doing all written in this book." “Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị fọdụrụ nʼIzrel na Juda, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a bụ nke achọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke a wụkwasịrị anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ edebeghị okwu nke Onyenwe anyị, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime akwụkwọ a banyere anyị.”
22 So Hilkiah and the king's men went to Huldah, the woman prophet, wife of Shallum son of Tokhath, son of Hasrah, keeper of the wardrobe. She lived in Jerusalem's Second Quarter. They spoke with her about this. Ya mere, Hilkaya na ndị ahụ eze zipụrụ ya na ha, jekwuuru Hulda, onye amụma nwanyị, onye bụ nwunye Shalum, nwa Tokhat, nwa Hasra. Onye nlekọta ebe a na-edebe uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.
23 She told them, "This is what our Father, the God of Israel, says: Tell the man who sent you to me: Ọ sịrị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị
24 This is what our Father says: I am about to bring disaster on this place and its residents—all the curses written in the book read to the king of Judah. ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a, bụ nke a gụpụtara nʼihu eze Juda.
25 Because they abandoned me and made offerings to other gods, provoking me to anger with all they have made, my wrath will pour out on this place and not be put out. Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na ihe niile nke aka ha mepụtara, a ga-awụkwasị iwe m nʼebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’
26 But tell the king of Judah, who sent you to inquire of me: This is what our Father, the God of Israel, says about the words you heard: Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ.
27 Because your heart was tender and you humbled yourself before our Father when you heard his words against this place and its residents, and humbled yourself before me, tore your clothes, and wept before me, I myself have heard you, declares our Father. Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe o kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na i wedara onwe gị nʼala nʼihu m, ma dọwaakwa uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m. Mụ onwe m anụla, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
28 I will gather you to your ancestors, laid in your grave in peace. Your eyes won't see any of the disaster I'm bringing on this place and its people." So they brought the king this reply. Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’ ” Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.
29 Then the king summoned all the elders of Judah and Jerusalem. Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị okenye Juda na Jerusalem niile.
30 The king went up to the house of our Father with all Judah's men, Jerusalem's residents, the priests, the Levites, and all the people, great and small. He read them all the words of the Book of the Covenant found in the house of our Father. Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.
31 The king stood in his place and made a covenant before our Father—to follow our Father, keep his commandments, testimonies, and statutes with all his heart and all his soul, and carry out the covenant's words written in this book. Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile rube isi nʼokwu ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ ahụ.
32 He made everyone present in Jerusalem and Benjamin pledge to it, and the people of Jerusalem acted by the covenant of our Father, the God of their fathers. O mekwara ka ndị niile nọ na Jerusalem na Benjamin kwee Onyenwe anyị otu nkwa ahụ. Ndị niile bi na Jerusalem mezukwara ihe ndị a dịka ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Chineke nna nna ha si dị.
33 Josiah removed all detestable things from the territory of the people of Israel, and made everyone in Israel serve our Father, their God. As long as he lived, they did not turn from following our Father. Josaya sitere nʼala niile bụ nke ndị Izrel wezuga ihe arụ niile bụ arụsị, o mere ndị niile nọ nʼIzrel nʼoge ahụ ka ha fee Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Nʼụbọchị ndụ ya niile, ha esiteghị nʼiso Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna wezuga onwe ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]