Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 33 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Manasseh was twelve years old when he became king, and he reigned fifty-five years in Jerusalem. Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na Jerusalem.
2 He did evil in our Father's sight, like the detestable things of the nations our Father drove out before the Israelites. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ nʼihu ndị Izrel.
3 He rebuilt the high places his father Hezekiah had torn down, built altars to the Baals, made Asherah poles, and he bowed down to all the forces of heaven and worshiped them. O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya kwadara, o wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nke Baal, pịakwa ogidi Ashera dị iche iche. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe feekwa ha ofufe.
4 He built altars in our Father's house, where our Father said, "In Jerusalem my name remains forever." O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya, sị, “Aha m ga-adịgide na Jerusalem ruo mgbe ebighị ebi.”
5 He built altars to all heaven's forces in both courts of the house of our Father. O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe nʼogige abụọ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
6 In the Valley of Ben-Hinnom he sacrificed his sons in the fire, practiced fortune-telling, omens, and witchcraft, and consulted mediums and spiritists. He did great evil before our Father, provoking his anger. O jikwa ụmụ ya chụọ aja nʼime ọkụ na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ọ gbara aja, taa amụsụ, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo iwe ya.
7 He set the carved image he made in the house of our Father, of which our Father said to David and his son Solomon, "In this house and in Jerusalem, which I chose from all the tribes of Israel, I will put my name forever. O were oyiyi apịrị apị nke o mere debe nʼime ụlọnsọ Chineke, nke Chineke gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.
8 I will never again remove Israel from the land I gave your ancestors, if only they carefully keep all I commanded them—the whole law, decrees, and rules through Moses." Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel hapụ ala ahụ nke m kenyere nna nna unu, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu banyere iwu niile, ụkpụrụ niile na ntụziaka niile m nyere site nʼaka Mosis.”
9 But Manasseh led Judah and Jerusalem's people astray, doing more evil than the nations our Father destroyed before Israel. Ma Manase duhiere Juda na ndị Jerusalem, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
10 Our Father spoke to Manasseh and his people, but they would not listen. Onyenwe anyị gwara Manase na ndị ya okwu, ma ha egeghị ntị.
11 So our Father brought the army commanders of Assyria's king against them; they captured Manasseh with hooks, bound him in bronze shackles, and took him to Babylon. Nʼihi ya, Onyenwe anyị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn.
12 Distressed, he sought our Father's favor, humbling himself deeply before the God of his fathers. Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka Onyenwe anyị Chineke nna nna ya.
13 He prayed to him, and our Father, moved by his plea, heard his cry for mercy, brought him back to Jerusalem, to his kingdom. Then Manasseh knew that our Father is God. Onyenwe anyị nụrụ arịrịọ ya mee ya ka ọ lọtakwa nʼalaeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase matara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
14 Afterward he rebuilt the City of David's outer wall, west of Gihon in the valley to the Fish Gate entrance, around the Ophel, raising it very high. He posted army commanders in all Judah's fortified cities. Ọ bụ nʼoge a ka o wughachiri mgbidi nke abụọ gburugburu obodo Devid, na mgbidi dị nʼọdịda anyanwụ iyi Gaihọn na ndagwurugwu Kidrọn. Site nʼebe ahụ, o wuru ya ruo nʼọnụ ụzọ ama Azụ, na gburugburu ugwu Ofel ebe o wuliri ya elu. O dokwara ndịisi agha ya nʼobodo niile e wusiri ike dị na Juda.
15 He removed the foreign gods and idol from our Father's house, with all the altars he'd built on the temple mount and in Jerusalem, and threw them out of the city. O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha.
16 He rebuilt our Father's altar, sacrificed peace and thank offerings on it, and commanded Judah to serve our Father, the God of Israel. Emesịa, o wugharịrị ebe ịchụ aja Onyenwe anyị dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, chụọ aja udo na aja ekele nʼelu ya. O nyekwara ndị Juda niile iwu sị ha fee Onyenwe anyị Chineke nke Izrel ofufe.
17 The people, however, still sacrificed at the high places, but only to our Father, their God. Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị Onyenwe anyị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a.
18 Manasseh's other acts, his prayer to our Father, and the seers' words to him in the name of our Father, the God of Israel, are in the records of Israel's kings. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile.
19 His prayer, how our Father was moved by him, all his sin and unfaithfulness, and the places where he built high places, set up Asherah poles, and carved images before he humbled himself—all recorded in the seers' records. Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma.
20 Manasseh died and was buried in his palace. And his son Amon became king in his place. Manase sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼụlọeze ya. Amọn, ọkpara ya, nọchiri ya.
21 Amon was twenty-two years old when he became king, and he reigned two years in Jerusalem. Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem.
22 He did evil before our Father, as his father Manasseh had. Amon sacrificed to all the carved images Manasseh made and worshiped them. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere. Amọn kpọrọ isiala, chụọkwa aja nye arụsị niile, nke Manase mere.
23 Unlike his father Manasseh, he did not humble himself before our Father; instead Amon multiplied his guilt. Ma o wedaghị onwe ya ala nʼihu Onyenwe anyị dịka Manase nna ya mere. Kama Amọn gara nʼihu mee ka ikpe ọmụma ya mụbaa.
24 Amon's servants conspired against him and killed him in his palace. Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu ya nʼime ụlọeze ya.
25 The people of the land killed all who conspired against King Amon and made his son Josiah king in his place. Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]