Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 32 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After these things and these acts of faithfulness, Sennacherib, Assyria's king, invaded Judah, besieged its fortified cities, meaning to break into them for himself. Mgbe Hezekaya ji ikwesi ntụkwasị obi rụchaa ọrụ ndị a niile, Senakerib bụ eze Asịrịa, bịara nʼime Juda megide ya. Ọ nọchibidoro obodo niile nke e wusiri ike, na-eche na ọ ga-emeri ha nye onwe ya.
2 When Hezekiah saw that Sennacherib had come, intent on making war against Jerusalem, Mgbe o doro eze anya na Senakerib bịara ka o buo agha megide Jerusalem,
3 he consulted his officials and warriors about blocking the springs outside the city, and they helped him. Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a.
4 Many people gathered and blocked all the springs and the stream flowing through the land, asking, "Why should Assyria's kings come and find abundant water?" Ha kpọkọtara ọtụtụ ndị ọrụ, ndị gara gbochie isi iyi niile, mee ka mmiri gharakwa ịsọpụta nʼala ahụ niile. Ha mere nke a nʼihi na ha achọghị ka eze ndị Asịrịa na ndị agha ya nweta mmiri ha ga-aṅụ mgbe ha bịaruru ibuso Jerusalem agha.
5 He worked hard to rebuild all the broken sections of the wall, raised towers on it, built another wall outside, strengthened the Millo of the city of David, and made abundant weapons and shields. Hezekaya wuzikwara mgbidi obodo ahụ, wusie ha ike nʼebe niile ọ na-ada ada. O wukwara mgbidi ọzọ gburugburu mgbidi nke ochie ahụ. O wusikwara ebe siri ike nke Milo dị nʼobodo Devid ike, kpụọkwa ọtụtụ ngwa agha na ọta.
6 He set war commanders over the people, gathered them at the city gate square, and encouraged them: O tinyere ndị agha niile nọ nʼobodo ahụ nʼokpuru ndịisi agha na-achị ha, mee ka ha niile zukọta nʼọnụ ụzọ ama nke obodo. Nʼebe ahụ ka ọ nọ gwa ha okwu sị ha,
7 "Be strong and brave. Don't fear or dread Assyria's king and all his horde, for more are with us than with him. “Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike.
8 With him is only an arm of flesh; with us is our Father, to help us and fight our battles." The people relied on Hezekiah king of Judah's words. Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ Onyenwe anyị, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume.
9 After this, while besieging Lachish with all his forces, Sennacherib king of Assyria sent his servants to Jerusalem, to Hezekiah king of Judah and all Judah there, saying: Mgbe e mesiri, mgbe Senakerib eze Asịrịa na ndị agha ya niile nọchibidoro Lakish, o zipụrụ ndị ọrụ ya gaa Jerusalem, ka ha jiri ozi a gaa maka Hezekaya, bụ eze Juda na ndị Juda niile ndị nọ nʼebe ahụ:
10 "This is what Sennacherib king of Assyria says: On what are you trusting, staying under siege in Jerusalem? “Nke a bụ ihe Senakerib, bụ eze Asịrịa sịrị: Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere, mere i ji nọgidesie ike na Jerusalem nʼọnọdụ nnọchibido a?
11 Isn't Hezekiah deceiving you, surrendering you to die by famine and thirst, when he says, 'The LORD our God will save us from the hand of the king of Assyria'? Mgbe Hezekaya na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị ga-azọpụta anyị site nʼaka eze Asịrịa,’ ọ bụ aghụghọ ka ọ na-aghọ unu. Ọ na-eduhie unu, na-achọ ka unu nwụọ nʼagụụ nakwa akpịrị ịkpọ nkụ.
12 Wasn't it Hezekiah who removed his high places and altars, telling Judah and Jerusalem to worship at one altar and burn offerings there? Ọ bụghị Hezekaya na onwe ya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, ‘Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼotu ebe ịchụ aja, chụọkwa aja nʼelu ya’?
13 Don't you know what I and my fathers did to all peoples of other lands? Could their nations' gods rescue their lands from my hand? “Unu amaghị ihe mụ na nna m ha bụ ndị bu m ụzọ chịa mere ndị ala ọzọ? Chi niile nke mba ndị ahụ niile ha nwere ike zọpụta ala ha site nʼaka m?
14 What god of nations my fathers devoted to destruction could save his people from my hand? How then can your God save you from my hand? Ọ bụ onye nʼetiti chi niile nke mba ndị a niile, bụ ndị nna nna m ha bibiri, napụtarala ndị ya site nʼaka m? Aṅaa ka chi unu ga-esi zọpụta unu site nʼaka m?
15 Don't let Hezekiah deceive or mislead you like this, and don't believe him: no god of any nation or kingdom could rescue his people from my hand or my fathers'—much less will your God rescue you from my hand!" Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, rafuokwa unu otu a. Unu ekwenyekwarala ya, nʼihi na ọ dịghị chi ọbụla maọbụ nke mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla pụrụ ịnapụta ndị ya site nʼaka m maọbụ nʼaka nna m ha. Ka ọ bụrụzie chi unu ga-abụ nke ga-anapụta unu site nʼaka m!”
16 And his servants spoke still more against our Father and against his servant Hezekiah. Nʼụzọ dị otu a ka ndị ozi Senakerib ahụ ji leda Onyenwe anyị Chineke, na Hezekaya anya kwuokwa okwu mkparị megide ha.
17 Sennacherib also wrote letters insulting our Father, the God of Israel, speaking against him: "The nations' gods did not rescue their people from my hand; neither will Hezekiah's God rescue his people from my hand." Emesịa, Senakerib dekwara akwụkwọ mkparị ndị ọzọ, nke ọ nọ nʼime ya kwuluo Onyenwe anyị Chineke Izrel, na-asị, “Dịka chi ndị ala ọzọ niile enweghị ike zọpụta ndị ha site nʼaka m, otu a kwa, Chineke nke Hezekaya apụghịkwa ịzọpụta ndị ya site nʼaka m.”
18 They shouted loudly in Judah's language to Jerusalem's people on the wall, to frighten and terrify them, to seize the city. Mgbe ahụ, ha ji oke olu kpọkuo ndị Jerusalem, bụ ndị nọ na mgbidi ahụ nʼasụsụ Hibru, imenye ha egwu nakwa ime ka ụjọ tụọ ha, ka ha nwee ike were obodo ahụ.
19 They spoke of Jerusalem's God like the gods of earth's peoples, the work of human hands. Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ.
20 Then King Hezekiah and the prophet Isaiah son of Amoz prayed about this, crying out to heaven. Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere.
21 So our Father sent an angel who killed every mighty warrior, commander, and officer in the Assyrian king's camp. Sennacherib returned home in disgrace, and when he entered his god's temple, some of his own sons killed him there with the sword. Onyenwe anyị zipụrụ otu mmụọ ozi, onye gara tigbuo ndị agha niile bụ dike, ndị ọchịagha na ndịisi niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu nke eze Asịrịa. Ya mere, Senakerib ji oke ihere laghachi nʼala ya. Ma mgbe ọ gara nʼụlọ chi ya, ụfọdụ nʼime ụmụ ya ndị ikom, ndị bụ anụ ahụ na ọbara ya, were mma agha gbuo ya nʼebe ahụ.
22 So our Father saved Hezekiah and Jerusalem's people from the hand of Sennacherib king of Assyria and all others, and he cared for them on every side. Otu a ka Onyenwe anyị si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile.
23 Many brought gifts to our Father in Jerusalem, and treasures to Hezekiah king of Judah; afterward all nations honored Hezekiah highly. Site nʼoge ahụ, Hezekaya ghọrọ eze a maara aha ya na mba niile dị Juda gburugburu. Ọtụtụ mmadụ bidokwara ibutere Onyenwe anyị onyinye dị iche iche na Jerusalem. Hezekaya nʼonwe ya nwetakwara onyinye nke ya.
24 In those days Hezekiah grew sick to death; he prayed to our Father, who answered, giving him a sign. Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube.
25 But Hezekiah didn't repay the good done him; his heart grew proud, so anger came on him and on Judah and Jerusalem. Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda.
26 Hezekiah humbled himself for his proud heart, he and Jerusalem's people, so our Father's wrath didn't reach them in Hezekiah's days. Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe Onyenwe anyị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ.
27 Hezekiah had great wealth and honor. He built storerooms for silver, gold, gems, spices, shields, and other valuables, Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.
28 storerooms for the harvest of grain, new wine, and oil; stalls for all kinds of livestock; pens for flocks. O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.
29 He built cities for himself and gained huge flocks and herds, for our Father gave him very great wealth. O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba.
30 Hezekiah stopped Gihon's upper outlet and directed the water down the west side of David's city. He succeeded in all he did. Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
31 When Babylon's rulers sent envoys to him asking about the land's sign, our Father left him to himself, to test him and to know all in his heart. Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi.
32 Hezekiah's remaining acts and faithful deeds are written in the vision of Isaiah the prophet, son of Amoz, in the Book of the Kings of Judah and Israel. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile.
33 Hezekiah slept with his ancestors, buried in the upper tombs of David's sons. All Judah and Jerusalem's residents honored him at death. His son Manasseh succeeded him. Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]