Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 31 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When this ended, all Israel present went out to the towns of Judah, smashed the sacred pillars, cut down the Asherah poles, and tore down the high places and altars throughout Judah, Benjamin, Ephraim, and Manasseh, destroying them completely. Then all Israel returned to their towns, each to his own property. Mgbe ihe niile a gwụsịrị, ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ pụrụ gaa nʼobodo niile dị na Juda, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. Ha kwatụrụ ebe niile dị elu na ebe ịchụ aja niile dị na Juda, Benjamin, Ifrem na Manase. Mgbe ha lachara ha niile nʼiyi, ndị Izrel niile laghachiri nʼobodo nke aka ha nakwa nʼihe onye ọbụla nwere.
2 Hezekiah assigned the priests and Levites to their divisions, each by his service, priests and Levites alike, for burnt offerings and peace offerings, to serve, give thanks, and praise in the gates of our Father's camps. Hezekaya kenyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị nʼusoro ịrụ ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke ụbọchị niile, maka ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo, na inye ekele, na ito Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ama ebe obibi ya.
3 The king gave from his own wealth for the burnt offerings—morning and evening burnt offerings, and those for Sabbaths, new moons, and appointed feasts—as written in our Father's law. Eze nyekwara ụtụ nke ya site nʼihe nweta ya maka iji chụọ aja nsure ọkụ, nke ụtụtụ na abalị, ya na aja nsure ọkụ nke ụbọchị izuike niile na ọnwa ọhụrụ, na nke mmemme niile a kara aka a na-eme dịka ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị.
4 He told Jerusalem's residents to give the priests' and Levites' portion, so they could devote themselves to our Father's law. O nyekwara ndị bi na Jerusalem iwu ka ha na-ewebatara ndị nchụaja na ndị Livayị oke nke ruuru ha, ka ha nwee ike lebanye anya nke ọma nʼiwu Onyenwe anyị.
5 As soon as the order spread, Israelites abundantly gave firstfruits of grain, new wine, oil, honey, and all the field's produce, and brought in the tenth of everything abundantly. Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere.
6 The Israelites and Judahites living in Judah's towns also brought the tenth of cattle and sheep, and the tenth of what was dedicated to our Father, piling them in heaps. Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu
7 They began piling the heaps in the third month, finishing in the seventh. Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.
8 Hezekiah and the officials came, saw the heaps, and blessed our Father and his people Israel. Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro Onyenwe anyị, gọziekwa ndị ya bụ Izrel.
9 Hezekiah asked the priests and Levites about the heaps. Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara.
10 Azariah the chief priest, of Zadok's house, answered him, "Since people began bringing contributions into our Father's house, we've eaten well with plenty remaining, for our Father blessed his people, leaving this large surplus." Azaraya, onyeisi nchụaja, onye sitere nʼikwu Zadọk zara sị ya; “Lee, kemgbe ndị mmadụ malitere iwebata onyinye ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Nʼezie, anyị nwere karịa, nʼihi na Onyenwe anyị agọziela ndị ya. Leekwa ihe dị ukwuu ka fọdụrụ.”
11 Then Hezekiah ordered them to prepare storerooms in the house of our Father, and they prepared them. Hezekaya nyere iwu ka e edozie ụlọ ịchịkọba ihe nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ha mekwara otu a.
12 They faithfully brought in the contributions, the tenth, and dedicated gifts. Conaniah the Levite led them; Shimei his brother was second. Emesịa, ha jiri ikwesi ntụkwasị obi bubata onyinye ndị ahụ, na onyinye nke otu ụzọ nʼime ụzọ iri, na onyinye e doro nsọ, tifee ha nʼaka Konanaya, onye Livayị. Shimei nwanne ya nwoke bụ onye na-esote ya.
13 Jehiel, Azaziah, Nahath, Asahel, Jerimoth, Jozabad, Eliel, Ismachiah, Mahath, and Benaiah oversaw, under Conaniah and his brother Shimei, appointed by King Hezekiah and Azariah, chief officer of our Father's house. Jehiel, Azazaya, Nahat, Asahel, Jerimot, Jozabad, Eliel, Ismakaya, Mahat na Benaya, bụ ndị nlekọta ọrụ ndị nọ nʼokpuru Konanaya na Shimei nwanne ya. Ndị a niile bụ ndị eze Hezekaya na Azaraya onye nlekọta ụlọnsọ ukwu Chineke họpụtara.
14 Kore son of Imnah, the Levite gatekeeper toward the east, oversaw the voluntary offerings to our Father, distributing our Father's contributions and the most holy gifts. Kore nwa Imna, onye Livayị, onye bụkwa onye na-elekọta ọnụ ụzọ ama dị nʼọwụwa anyanwụ, ka e tinyere ọrụ ilekọta onyinye afọ ofufu niile e wetaara Chineke. Ọ bụ ya nwekwa ọrụ ikesa onyinye ndị ahụ niile e bubataara Onyenwe anyị ha na onyinye ndị ọzọ e doro nsọ.
15 Under him, Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaiah, Amariah, and Shecaniah served faithfully in the priestly towns, distributing to fellow priests by divisions, great and small alike, Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka.
16 besides giving to those registered by genealogy, males three and up—all entering the house of our Father for daily duty—for their service by office and division. Ọzọkwa, ndị ikom niile si nʼezinaụlọ ndị nchụaja, ndị gbara site nʼafọ atọ gbagoo, ndị aha ha dị nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na-eketa oke ihe oriri ha na-eri mgbe ọbụla ha bịara ịrụ ọrụ dịka usoro ọrụ ha si dị.
17 Priests were registered by clans; Levites twenty and up, by duty and division. Ha na-ekenye ndị nchụaja niile e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, kenyekwa ndị Livayị niile gbara site iri afọ abụọ gbagoo ihe oriri dịka usoro ọrụ ha si dị.
18 They were registered with all their little ones, wives, sons, and daughters—the whole community—for they faithfully dedicated themselves in holiness. Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ.
19 For Aaron's priestly descendants living in the pasture-fields around their towns, men were named in each and every town to give shares to every male priest and all Levites listed by genealogy. A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị.
20 Hezekiah did this throughout all Judah. He did what was good, right, and faithful before our Father. Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya.
21 In all he undertook—serving the house of our Father, keeping the law and command, seeking our Father—he gave his whole heart, and thrived. Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]