Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 30 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Hezekiah sent word to all Israel and Judah, and wrote letters to Ephraim and Manasseh, to come to the house of our Father in Jerusalem to keep the Passover to our Father, the God of Israel. Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
2 The king, his officials, and the whole assembly in Jerusalem had decided to keep the Passover in the second month, Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ.
3 since they could not keep it then, because too few priests had made themselves holy and the people had not gathered at Jerusalem. Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem.
4 The plan seemed right to the king and to all the assembly, Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a.
5 so they sent a proclamation throughout Israel, from Beersheba to Dan, that the people should come to Jerusalem to keep the Passover to our Father, the God of Israel; for they had not kept it together in great numbers as written. Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu.
6 The couriers went through all Israel and Judah with letters from the king and his officials, ordered by the king: "Children of Israel, return to our Father, the God of Abraham, Isaac, and Israel, so he may return to the remnant of you who survived and escaped the power of the kings of Assyria. Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si: “Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị.
7 Do not be like your fathers and brothers, who were unfaithful to our Father, the God of their fathers, so he made them a desolation, as you see. Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya.
8 Don't be stubborn like your fathers; give yourselves to our Father and come to his sanctuary, which he dedicated forever, and serve your Father, so his fierce anger turns from you. Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ.
9 For if you return to our Father, your brothers and your children will find compassion from their captors and return to this land. For your Father is gracious and merciful; he will not turn his face from you if you return to him." Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya.”
10 The couriers went from city to city through Ephraim and Manasseh to Zebulun, but the people laughed at them and mocked them. Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo.
11 Even so, some from Asher, Manasseh, and Zebulun humbled themselves and came to Jerusalem. Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem.
12 The hand of our Father was also on Judah, giving them one heart to do what the king and officials commanded by the word of our Father. Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.
13 A very large assembly gathered at Jerusalem to keep the Feast of Bread Without Yeast in the second month. Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko.
14 They set to work and removed the altars in Jerusalem, and they took away all the incense altars, throwing them into the Kidron Valley. Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.
15 They slaughtered the Passover lamb on the fourteenth of the second month. The priests and Levites were ashamed, so they dedicated themselves and brought burnt offerings to the house of our Father. Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
16 They stood at their posts by custom, as the Law of Moses the man of God requires; the priests sprinkled the blood the Levites handed them. Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja.
17 Many in the assembly had not dedicated themselves, so the Levites were in charge of killing the Passover lambs for everyone unclean, to dedicate them to our Father. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị.
18 A large number of the people, many from Ephraim, Manasseh, Issachar, and Zebulun, had not purified themselves, yet ate the Passover, though not as written. But Hezekiah prayed for them: "May our good Father pardon everyone, Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla
19 who sets his heart to seek our Father, the God of his fathers, though not clean by the sanctuary's rules." bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.”
20 And our Father listened to Hezekiah and healed the people. Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha.
21 The Israelites in Jerusalem kept the Feast of Bread Without Yeast seven days with great joy, and day by day the Levites and priests praised our Father with loud instruments resounding to him. Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.
22 Hezekiah spoke encouragingly to all the Levites skilled in serving our Father. For seven days they ate their festival share, offering peace offerings and giving thanks to our Father, the God of their fathers. Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.
23 Then the whole assembly agreed to keep the feast another seven days, and they kept it seven more days with joy. Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ.
24 Hezekiah king of Judah gave the assembly 1,000 bulls and 7,000 sheep, and the officials gave 1,000 bulls and 10,000 sheep, and many priests dedicated themselves. Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ.
25 All Judah's assembly rejoiced, with the priests, the Levites, the whole assembly that came from Israel, and the foreigners from Israel's land and those living in Judah. Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa.
26 Great joy filled Jerusalem, for nothing like this had happened there since the days of Solomon son of David, king of Israel. Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem.
27 The priests and Levites rose to bless the people, and their voice was heard; their prayer reached his holy home in heaven. Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]