Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 29 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Hezekiah became king at twenty-five, reigning twenty-nine years in Jerusalem. His mother: Abijah, daughter of Zechariah. Hezekaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija, ada Zekaraya.
2 He did right in our Father's eyes, just as his father David had done. O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna nna ya Devid mere.
3 In his reign's first year, first month, he opened the doors of our Father's house and repaired them. Nʼọnwa mbụ nke afọ ahụ e mere ya eze ka o meghere ụlọnsọ Onyenwe anyị, mezie ime ya.
4 He brought in the priests and the Levites and gathered them in the eastern square. Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,
5 He told them, "Hear me, Levites! Dedicate yourselves now, and dedicate our Father's house, the God of your fathers, and remove the filth from the Holy Place. gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ.
6 Our ancestors were unfaithful, doing evil in our Father's eyes; they abandoned him, turned their faces from our Father's dwelling, and turned their backs. Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi Onyenwe anyị, gbakụtakwa ya azụ.
7 They also shut the entrance hall doors, extinguished the lamps, and did not burn incense or offer burnt offerings in the sanctuary to our Father, the God of Israel. Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel.
8 So our Father's anger fell on Judah and Jerusalem, making them an object of terror, horror, and scorn, as you see with your own eyes. Nʼihi nke a ka iwe Onyenwe anyị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ.
9 For our fathers fell by the sword; our sons, daughters, and wives are captive for this. E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya.
10 Now I intend to make a covenant with our Father, the God of Israel, so his fierce anger turns from us. Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ.
11 My sons, don't be negligent now—our Father chose you to stand before him, serve him, be his servants, and burn incense." Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.”
12 The Levites stood: Kohathites—Mahath, Amasai's son, and Joel, Azariah's son; Merarites—Kish, Abdi's son, and Azariah, Jehallelel's son; Gershonites—Joah, Zimmah's son, and Eden, Joah's son; Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ: site nʼikwu Kohat: Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya; nʼikwu Merari: Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel; nʼikwu Geshọn: Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa;
13 of the sons of Elizaphan, Shimri and Jeiel; of the sons of Asaph, Zechariah and Mattaniah; nʼikwu Elizafan: Shimri, na Jeiel; nʼikwu Asaf: Zekaraya, na Matanaya;
14 of the sons of Heman, Jehiel and Shimei; and of the sons of Jeduthun, Shemaiah and Uzziel. nʼikwu Heman: Jehiel, na Shimei; nʼikwu Jedutun: Shemaya, na Uziel.
15 They gathered their brothers, made themselves holy, and went to clean our Father's house, as the king commanded by our Father's words. Mgbe ha kpọkọtara ụmụnna ha bụ ndị Livayị, dokwaa onwe ha ọcha, ha bara ido ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ, dịka eze nyere nʼiwu, nʼusoro okwu Onyenwe anyị si dị.
16 The priests entered our Father's inner house to cleanse it, bringing all the impurity they found in our Father's temple out to the courtyard. The Levites carried it out to the Kidron brook. Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn.
17 They began dedicating the first day of month one; by the eighth day of that month, they reached our Father's entrance hall. They dedicated the house of our Father eight days, finishing the sixteenth day of month one. Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ.
18 Then they came in to King Hezekiah and said, "We have cleaned all of our Father's house—the altar of burnt offering with all its utensils, and the table of the Bread of the Presence with all its utensils. Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya.
19 All the utensils King Ahaz discarded during his unfaithful reign we have prepared and dedicated—they stand before our Father's altar." Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.”
20 King Hezekiah rose early, gathered the city's officials, and went up to our Father's house. Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.
21 They brought seven bulls, seven rams, seven lambs, seven male goats as a sin offering for the kingdom, sanctuary, and Judah, and he commanded Aaron's sons, the priests, to offer them on our Father's altar. Ha wetara oke ehi asaa, na ebule asaa, na ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa, maka ịchụ aja mmehie nʼihi alaeze ahụ, maka ụlọnsọ ukwu ahụ, na ala Juda. Eze nyere ndị nchụaja bụ ụmụ Erọn iwu sị ha gbuo anụ ụlọ ndị ahụ nʼebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
22 They killed the bulls; the priests took the blood and splashed it on the altar. They killed the rams and splashed the blood on the altar, then killed the lambs and splashed the blood on the altar. Ya mere, ha gburu oke ehi ahụ niile. Ndị nchụaja fesara ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja. Ha gbukwara ebule ndị ahụ fesa ọbara ha nʼebe ịchụ aja, gbukwaa ụmụ atụrụ ndị ahụ fesakwa ọbara ha nʼebe ịchụ aja.
23 They brought the sin-offering goats before the king and assembly, and laid their hands on them. Ha wetara mkpi ndị ahụ eji achụ aja mmehie nʼihu eze na ọgbakọ ahụ, ha bikwasịkwara ha aka nʼelu.
24 The priests slaughtered them and made a sin offering with their blood on the altar to atone for all Israel, because the king had ordered the burnt offering and sin offering for all Israel. Ndị nchụaja gburu mkpi ndị ahụ, chee ọbara ha nʼelu ebe nchụaja maka ikpuchi mmehie ndị Izrel niile. Nʼihi na eze nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ na aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile.
25 He stationed the Levites in our Father's house with cymbals, harps, and lyres, as David, Gad the king's seer, and Nathan the prophet commanded—for the command came from our Father through his prophets. O mere ka ụfọdụ ndị Livayị nọdụ nʼụlọnsọ ahụ, dịka ndị na-abụ abụ. O nyere ha ogene, na une, na ụbọ akwara. O mere nke a nʼusoro dịka Devid na Gad, bụ ọhụ ụzọ eze, na Netan, bụ onye amụma, nke a bụ dịka Onyenwe anyị nyererịị nʼiwu site nʼaka ndị amụma ya.
26 The Levites stood with the instruments of David, and the priests with the trumpets. Ya mere, ndị Livayị ji ihe egwu Devid ndị ahụ niile guzoro na njikere, ma ndị nchụaja jikwa opi ha nke ha na-afụ.
27 Hezekiah ordered the burnt offering on the altar; when it began, the song of our Father began too, with the trumpets and the instruments of David, king of Israel. Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel.
28 The whole assembly bowed, the singers sang, the trumpeters sounded, until the burnt offering was finished. Nʼoge mmemme ọchụchụ aja ahụ, mmadụ niile kpọrọ isiala nye Chineke, mgbe ndị abụ na-abụ abụ, ndị opi na-afụkwa opi ha. Ihe niile a nọ na-eme tutu ruo mgbe a chụsịrị aja niile ahụ.
29 When the offering ended, the king and all present with him bowed and worshiped. Mgbe ha chụchara aja ndị ahụ, eze na ndị niile nọ nʼebe ahụ gburu ikpere nʼala, kpọkwaa isiala.
30 King Hezekiah and the officials had the Levites praise our Father with words from David and Asaph the seer. They sang for joy, bowed low, and worshiped. Eze Hezekaya na ndịisi ozi ya nyere iwu ka ndị Livayị bụọ ụfọdụ nʼime abụ ọma Devid, na nke Asaf onye amụma, maka iji ya too Onyenwe anyị. Ha mere otu a, kpọọkwa isiala nye Chineke.
31 Then Hezekiah said, "You have now dedicated yourselves to our Father. Come near, bring sacrifices and thank offerings to our Father's house." So the assembly brought sacrifices and thank offerings; all willing hearts brought burnt offerings. Emesịa, Hezekaya sịrị, “Ugbu a unu edoola onwe unu nsọ nye Onyenwe anyị, bịanụ nso, webatanụ aja na onyinye ekele nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” Ya mere, nzukọ ahụ niile wetaara aja na onyinye ekele ha, ndị niile nwere mkpebi nʼobi ha wetara aja nsure ọkụ.
32 The assembly brought seventy bulls, one hundred rams, 200 lambs—all as a burnt offering to our Father. Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile ha wetara bụ ndị a: iri oke ehi asaa, na narị ebule, na narị ụmụ ebule abụọ, ka e wetara maka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
33 And the consecrated offerings were 600 bulls and 3,000 sheep. Anụ ndị e doro nsọ maka ịchụ aja dị narị oke ehi isii na atụrụ na ewu dị puku atọ.
34 The priests were too few to skin all the burnt offerings, so their Levite brothers helped them until the work was done and until the priests made themselves holy; the Levites were more honest in heart to make themselves holy than the priests. Ma ndị nchụaja dị ole na ole, ha apụghịkwa ịgba akpụkpọ anụ niile ahụ maka aja nsure ọkụ, nʼihi ya, ụmụnne ha bụ ndị Livayị nyeere ha aka tutu ruo mgbe ozi ahụ gwụsịrị, ruokwa mgbe e doro ndị nchụaja ndị ọzọ nsọ. Nʼihi na ndị Livayị nwere obi ziri ezi karịa ndị nchụaja ido onwe ha nsọ.
35 Besides the many burnt offerings, there was fat from peace offerings and drink offerings for them. So the service of our Father's house was restored. Aja nsure ọkụ bara ụba, tinyere abụba nke aja udo niile, na aja ihe ọṅụṅụ nke so aja nsure ọkụ ndị a. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si weghachite ije ozi na ịchụ aja nke na-adị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
36 Hezekiah and all the people rejoiced over what our Father prepared for them, since it happened suddenly. Hezekaya na ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ihe Chineke doziri nye ndị ya, nʼihi na ihe niile ndị a mere ngwangwa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]