Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 28 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Ahaz became king at twenty; he reigned sixteen years in Jerusalem. He did not do right in our Father's eyes, as his ancestor David had. Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara afọ iri na isii nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya Devid mere.
2 Instead, he walked in the ways of Israel's kings and cast metal idols for the Baals. Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, kpụọkwa arụsị dị iche iche maka ofufe arụsị Baal.
3 He burned incense in Ben-Hinnom Valley and burned his sons in fire, copying detestable practices of the nations our Father drove out before Israel. O surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị iche iche nʼime Ndagwurugwu nke Ben Hinom, surekwaa ụmụ ya nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel.
4 He sacrificed and burned incense on the high places, the hills, and under every leafy tree. Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla.
5 So our Father gave him to Aram's king, who struck him, took many captives to Damascus; he was also given to Israel's king, who struck him a heavy blow. Nʼihi ya, Onyenwe anyị Chineke ya nyefere ya nʼaka eze ndị Aram. Ndị Aram lụgburu ya, kpọrọ ọtụtụ nʼetiti ndị ya dịka ndị mkpọrọ kpọta ha nʼDamaskọs. E nyefekwara ya nʼaka eze Izrel, onye gburu ọtụtụ ndị agha ya.
6 Pekah son of Remaliah killed 120,000 brave men of Judah in one day, because they abandoned our Father, the God of their ancestors. Nʼotu ụbọchị, Peka nwa Remalaya gburu narị puku ndị agha Juda na iri puku abụọ. Ihe ndị a mere nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha azụ.
7 Zichri, an Ephraim warrior, killed Maaseiah the king's son, Azrikam the palace commander, and Elkanah, the king's second. Zikri onye Ifrem, onye bụ dike nʼagha, gburu Maaseia, nwa eze, na Azrikam onye na-elekọta ụlọeze. O gbukwara Elkena onye na-esota eze.
8 Israel captured 200,000 relatives—women, sons, daughters—and much plunder, carrying it off to Samaria. Ndị Izrel sitere nʼetiti ụmụnne ha ndị Juda dọta ndị inyom, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ nʼagha. Ha bukọkwaara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha kwatara nʼagha laghachi na Sameria.
9 Oded, a prophet of our Father, was there. He met the army returning to Samaria: "See, our Father, the God of your ancestors, was angry with Judah, so he handed them to you. But you killed them with rage reaching heaven. Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe.
10 Now you intend to enslave Judah and Jerusalem's people, male and female. Aren't you yourselves guilty of sins against your Father? Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ?
11 Now listen: send back the relatives you captured, for our Father's fierce anger is on you." Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”
12 Some Ephraimite chiefs—Azariah son of Johanan, Berechiah son of Meshillemoth, Jehizkiah son of Shallum, Amasa son of Hadlai—opposed those coming from battle. Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta.
13 "Don't bring the captives here," they said. "You plan to add to our sins and guilt against our Father. Our guilt is already great, and fierce anger hangs over Israel." Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.”
14 So the soldiers handed the captives and plunder in front of the officials, before the whole assembly. Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile.
15 The named men took the captives and clothed all the naked from the plunder. They gave them clothes and sandals, food and drink, and anointed them with oil. They set the feeble on donkeys, brought them to their fellow Israelites at Jericho, city of palms, then returned to Samaria. Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria.
16 At that time King Ahaz sent to the king of Assyria for help. Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka.
17 The Edomites had invaded Judah once again and carried off captives, Ndị Edọm bịara ọzọ buso Juda agha, ma dọrọkwa ọtụtụ nʼime ha nʼagha.
18 while Philistines raided Judah's lowland and Negev towns, seizing Beth-shemesh, Aijalon, Gederoth, Soco, Timnah, and Gimzo with their villages, and settled there. Ndị Filistia na-ebusokwa ụfọdụ obodo Juda dị na mgbada ugwu, na Negeb agha. Ha meriri ma bichikwaa obodo ndị a; Bet-Shemesh, na Aijalon, na Gederọt, na Soko, na Timna, na Gimzo, na obodo nta niile gbara ha gburugburu.
19 Our Father humbled Judah because of Ahaz king of Israel, who spread wrongdoing in Judah and betrayed our Father completely. Ma Onyenwe anyị wedara Juda nʼala nʼihi Ehaz, eze Izrel onye mere ka ihe ọjọọ baa ụba na Juda, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị.
20 Tiglath-pileser king of Assyria came to Ahaz, but Tiglath-pileser brought him trouble instead of help. Mgbe Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka.
21 Ahaz stripped our Father's house, the royal palace, and the officials of their treasures, giving them to Assyria's king—yet it brought him no help. Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka.
22 In his time of distress, this same King Ahaz became even more unfaithful to our Father. Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
23 He sacrificed to Damascus's gods, his defeaters, thinking, "Aram's kings' gods helped them; I'll sacrifice to them so they'll help me." But they ruined him and all Israel. Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile.
24 Ahaz gathered the articles of our Father's house and cut them to pieces, shut the doors of our Father's house, and set up altars for himself at every corner in Jerusalem. Ehaz chịkọtara ngwongwo niile dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, gbujasịa ha. O mechiri ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ma wuo ọtụtụ ebe ịchụ aja na nkuku ụzọ niile nʼime Jerusalem.
25 In every Judah town he built high places to burn offerings to other gods, angering our Father, the God of his ancestors. Nʼobodo niile ọbụla na Juda, o wuru ebe dị elu maka ịchụ aja dị iche iche nye chi ndị ọzọ, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha iwe.
26 The rest of his deeds and all his ways, first to last, are written in the Book of the Kings of Judah and Israel. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda na Izrel?
27 Ahaz rested with his ancestors, buried in Jerusalem, but not in Israel's kings' tombs. His son Hezekiah reigned instead. Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Jerusalem, ma ọ bụghị nʼime ili ebe a na-eli ndị eze Izrel. Hezekaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]