Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Chronicles 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 All Israel was registered by genealogy, recorded in the Book of the Kings of Israel. And Judah was exiled to Babylon for their unfaithfulness. E dere usoro ọmụmụ ụmụ Izrel niile nʼime akwụkwọ ndị eze Izrel na Juda. Emesịa, a dọọrọ ha nʼagha buru ha gaa Babilọn nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
2 The first to resettle their own property in their cities were Israel, the priests, the Levites, and the temple servants. Nʼime ndị a, ndị bụ ụzọ lọta bịa birikwa nʼihe onwunwe ha nʼobodo nke aka ha bụ ụfọdụ ndị Izrel, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
3 And in Jerusalem lived some of the people of Judah, of Benjamin, and of Ephraim and Manasseh: Ndị si nʼebo Juda, na Benjamin, na Ifrem na Manase lọta bịa biri na Jerusalem bụ ndị a:
4 Uthai son of Ammihud son of Omri son of Imri son of Bani, of the sons of Perez son of Judah. Utai nwa Amihud, nwa Omri, nwa Imri, nwa Bani, onye ikwu Perez, nwa Juda.
5 And of the Shilonites: Asaiah the firstborn, and his sons. Nʼezinaụlọ Shilo: Asaya nwa mbụ ya na ụmụ ya ndị ikom.
6 From Zerah's sons: Jeuel and their relatives, 690. Ụmụ Zera, Jeuel so nʼime ha. Ọnụọgụgụ ndị Juda niile lọtara dị narị isii na iri itoolu (690).
7 And of Benjamin's sons: Sallu son of Meshullam, son of Hodaviah, son of Hassenuah, Ụmụ Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaya, nwa Hasenua;
8 Ibneiah son of Jeroham; Elah son of Uzzi son of Michri; Meshullam son of Shephatiah son of Reuel son of Ibnijah, na Ibneia nwa Jeroham; Elaa nwa Uzi, nwa Mikri; na Meshulam nwa Shefataya, nwa Reuel, nwa Ibnija.
9 and their relatives, listed by family line, 956. All these were heads of their ancestral families. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị Benjamin niile lọtara ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ha, dị narị itoolu na iri ise na isii (956).
10 And of the priests: Jedaiah, Jehoiarib, Jachin, Ndị nchụaja: Jedaya, Jehoiarib na Jakin;
11 and Azariah son of Hilkiah, son of Meshullam, son of Zadok, son of Meraioth, son of Ahitub, chief officer of our Father's house. Azaraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, na Meraiot, nwa Ahitub. Azaraya bụ onye na-elekọta ụlọnsọ ukwu Chineke.
12 Adaiah son of Jeroham, of Pashhur, of Malchijah; and Maasai son of Adiel, of Jahzerah, of Meshullam, of Meshillemith, of Immer; Ndị nchụaja ọzọ lọtaranụ bụ Adaya nwa Jeroham, nwa Pashua, nwa Malkija. Onye ọzọ bụ Maasai nwa Adiel, nwa Jazera, nwa Meshulam nwa Meshilemit, nwa Imea
13 and their relatives—heads of their families—1,760, capable men for serving in the house of our Father. Ọnụọgụgụ ndị nchụaja lọtaranụ bụ otu puku na narị asaa, na iri isii (1,760). Ha niile bụkwa ndịisi ezinaụlọ, ndị tozuru etozu ịrụ ọrụ ha, ndị ọrụ ha bụ ije ozi nʼụlọnsọ Chineke.
14 Of the Levites: Shemaiah son of Hasshub, son of Azrikam, son of Hashabiah, of the sons of Merari, Ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya onye ikwu Merari.
15 and Bakbakkar, Heresh, Galal, and Mattaniah son of Mica, son of Zichri, son of Asaph; Bakbaka, Heresh, Galal, na Matanaya nwa Mika, nwa Zikri, nwa Asaf;
16 and Obadiah son of Shemaiah, son of Galal, son of Jeduthun, and Berechiah son of Asa, son of Elkanah, who lived in the villages of the Netophathites. Ọbadaya nwa Shemaya, nwa Galal, nwa Jedutun; na Berekaya nwa Asa, nwa Elkena onye biri nʼobodo nta ndị Netofa.
17 The gatekeepers: Shallum, Akkub, Talmon, Ahiman, and their relatives; Shallum was chief. Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị: Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha.
18 To this day they stand at the King's Gate, on the east side. These were the gatekeepers of the Levite camps. Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị.
19 Shallum son of Kore, of Ebiasaph, of Korah, and his relatives of his father's house, the Korahites, oversaw the work of service, guarding the tent's thresholds; their fathers oversaw the camp of our Father, guarding the entrance. Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
20 Phinehas son of Eleazar was leader over them formerly; our Father was with him. Finehaz nwa Elieza bụ onyeisi ndị mbụ rụrụ ọrụ a na mgbe ochie, Onyenwe anyị nọnyekwaara ya.
21 Zechariah the son of Meshelemiah was gatekeeper at the entrance of the tent of meeting. Mgbe ahụ, Zekaraya nwa Meshelemaia bụ onye na-elekọta ọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ ikwu.
22 All of them, chosen as gatekeepers of the gates, numbered 212, registered by genealogy in their villages. David and Samuel the seer had appointed them to this trusted office. Ọnụọgụgụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nʼoge ahụ bụ narị abụọ na iri na abụọ (212). E depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nke obodo nta ha. Ndị nche ọnụ ụzọ ama ndị a bụ ndị Devid na Samuel onye amụma họpụtara nye ha ọnọdụ a nʼihi na-atụkwasịrị ha obi.
23 They and their sons guarded the gates of the house of our Father, the house of the tent, as guards. Ha na ụmụ ụmụ ha ka e tinyere ya nʼaka iche ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
24 The gatekeepers were posted on the four sides: east, west, north, and south. Ha na-eche akụkụ anọ ya niile, ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu na ndịda.
25 Their relatives in their villages were to come every seven days, from time to time, to be with them. Ụbọchị asaa ka ha na-anọ nʼọrụ a. Emesịa, ụmụnna ha na-abịa gbanwee ha. Ya mere, ha na-agbanwe onwe ha ụbọchị asaa asaa.
26 The four chief gatekeepers, Levites, were entrusted with the chambers and treasuries of the house of our Father. Ma ndịisi nche ọnụ ụzọ ama anọ ndị ahụ bụ ndị Livayị ka esitere nʼịtụkwasị obi nyefee ọrụ ilekọta ime ụlọ niile nakwa ụlọakụ niile dị nʼime ụlọ Chineke nʼaka.
27 They stayed the night around our Father's house, since the guard duty was theirs, and the opening, morning by morning. Ha na-eche nche gburugburu ụlọnsọ Chineke abalị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka ọ dị nʼaka iche ya nche. Ọ bụkwa ha ka e nyefere ọrụ imeghe ya ụtụtụ niile.
28 Some were in charge of the service vessels, counting them in and out. Ụfọdụ nʼime ha ka ọ dị nʼaka ilekọta ngwongwo e ji achụ aja. Ha na-agụ ya ọnụ mgbe ọbụla e webatara ya, na mgbe ọbụla a na-ewepụ ya.
29 Others were in charge of the furnishings, sacred utensils, fine flour, wine, oil, incense, and spices. Ndị ọzọ na-elekọta ihe niile e ji chọọ ụlọnsọ ahụ mma, ya na ụtụ ọka, na mmanya, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda dị iche iche.
30 And some of the priests' sons blended the spices. Ma ọ bụ ndị nchụaja ndị ọzọ ka e nyere ọrụ ịsụ, ịgwakọta na ịkpụkọta ụda na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
31 Mattithiah, one of the Levites, firstborn of Shallum the Korahite, was in charge of baking the flat cakes. Matitaia, onye Livayị, ọkpara Shalum, onye ikwu Kora, ka esitere na ntụkwasị obi nyefee ya ọrụ ime achịcha onyinye.
32 Some Kohathite relatives were responsible for preparing the rows of bread every Sabbath. Ụfọdụ nʼime ndị ikwu Kohat ka ọ dị nʼaka ime achịcha pụrụ iche, a na-adọkwasị nʼelu tebul, nʼụbọchị izuike niile.
33 These singers, heads of Levite families, stayed in the temple chambers, exempt from other duties—on duty day and night. Ndị ọbụ abụ, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị na-anọgide nʼime ọnụụlọ ndị dị nʼụlọnsọ ukwu nʼihi na e kweghị ka ha rụọ ọrụ ọzọ ebe ọ bụ na ha na-arụ ọrụ ịbụ abụ ehihie na abalị niile.
34 These were heads of Levite families, leaders listed by family line; and they lived in Jerusalem. Ha niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼebo Livayị. Ndị ndu dịka e depụtakwara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ha bikwa na Jerusalem.
35 In Gibeon lived Jeiel the father of Gibeon, and the name of his wife was Maacah, Jeiel nna Gibiọn bụ na Gibiọn ka o bi, Aha nwunye ya bụ Maaka.
36 and his firstborn son was Abdon, then Zur, Kish, Baal, Ner, Nadab, Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,
37 Gedor, Ahio, Zechariah, and Mikloth. Gedoa, Ahio, Zekaraya na Miklot.
38 Mikloth fathered Shimeam; they too lived with their relatives in Jerusalem, opposite their relatives. Miklot bụ nna Shimeam. Ha onwe ha sokwa ụmụnna ha biri na Jerusalem.
39 And Ner fathered Kish, Kish fathered Saul, and Saul fathered Jonathan, Malchi-shua, Abinadab, and Esh-baal. Nea mụrụ Kish nna Sọl, onye bụ nna Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.
40 And the son of Jonathan was Merib-baal, and Merib-baal fathered Micah. Jonatan mụrụ Merib-Baal nna Maịka.
41 The sons of Micah: Pithon, Melech, Tahrea, and Ahaz. Maịka mụrụ Piton, Melek, Tahrea na Ehaz.
42 And Ahaz fathered Jarah, and Jarah fathered Alemeth, Azmaveth, and Zimri; and Zimri fathered Moza. Ehaz mụrụ Jada. Jada bụ nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza.
43 And Moza fathered Binea, and Rephaiah was his son, Eleasah his son, and Azel his son. Moza mụrụ Binea, nna Refaya, nna Eleasa, nna Azel.
44 Azel had six sons, named Azrikam, Bocheru, Ishmael, Sheariah, Obadiah, and Hanan—these were Azel's sons. Azel mụrụ ụmụ isii: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]