Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Chronicles 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The sons of Issachar were Tola, Puah, Jashub, and Shimron—four in all. Isaka mụrụ ụmụ anọ: Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
2 Tola's sons: Uzzi, Rephaiah, Jeriel, Jahmai, Ibsam, and Shemuel—heads of their clans, mighty warriors in the line of Tola through their generations. In David's days their count was 22,600. Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a: Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii. (22,600).
3 Uzzi's son: Izrahiah. Izrahiah's sons: Michael, Obadiah, Joel, Isshiah—five chiefs in all. Uzi mụrụ Izrahaya. Izrahaya amụta ndị a: Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha.
4 With them, by generations and family lines, were 36,000 troops for war, since they had many wives and children. Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii (36,000), nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ.
5 Their relatives, all Issachar's clans, were 87,000 mighty warriors, listed by genealogy. Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa (87,000) nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
6 Three sons of Benjamin: Bela, Becher, and Jediael. Benjamin mụrụ ndị ikom atọ: Bela, Beka na Jediael,
7 Bela's sons: Ezbon, Uzzi, Uzziel, Jerimoth, and Iri—five family heads, mighty warriors. Their genealogy counted 22,034. Bela mụrụ ụmụ ise: Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ (22,034). E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
8 Becher's sons: Zemirah, Joash, Eliezer, Elioenai, Omri, Jeremoth, Abijah, Anathoth, and Alemeth—all sons of Becher. Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet.
9 Their genealogical record, by their generations, listed the heads of their ancestral families and 20,200 mighty warriors. Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ (20,200).
10 Jediael's son was Bilhan; Bilhan's sons were Jeush, Benjamin, Ehud, Chenaanah, Zethan, Tarshish, and Ahishahar. Jediael mụrụ otu nwa nwoke: aha ya bụ Bilhan. Ụmụ Bilhan bụ Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha.
11 These were Jediael's sons, family heads, mighty warriors—17,200 fit for military service. Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha.
12 Shuppim and Huppim were the descendants of Ir, and the Hushites the descendants of Aher. Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
13 The sons of Naphtali were Jahziel, Guni, Jezer, and Shallum—the descendants of Bilhah. Ụmụ Naftalị mụtara bụ Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
14 Manasseh's sons: Asriel, whom his Aramean concubine bore; she also bore Machir, father of Gilead. Ụmụ Manase: Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
15 Machir took a wife from among the Huppites and Shuppim; his sister's name was Maacah. The second was named Zelophehad; he had only daughters. Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.
16 Machir's wife Maacah bore a son and named him Peresh; his brother was Sheresh; his sons were Ulam and Rakem. Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
17 The son of Ulam: Bedan. These were the sons of Gilead son of Machir, son of Manasseh. Nwa nwoke Ụlam mụtara bụ Bedan. Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
18 His sister Hammolecheth gave birth to Ishhod, Abiezer, and Mahlah. Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
19 The sons of Shemida were Ahian, Shechem, Likhi, and Aniam. Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a: Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
20 Ephraim's sons: Shuthelah, his son Bered, his son Tahath, his son Eleadah, his son Tahath. Ụmụ Ifrem bụ Shutela, Bered, Tahat, Eleada, Tahat
21 His son Zabad, his son Shuthelah. The men of Gath, born in that land, killed Ezer and Elead when they went down to take the Gathites' livestock. na Zabad nwa ya, na Shutela nwa ya. Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ.
22 Their father Ephraim mourned for many days, and his relatives came to comfort him. Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi.
23 He slept with his wife; she conceived and bore a son he named Beriah, because tragedy had struck his household. Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza.
24 His daughter was Sheerah, who built Lower and Upper Beth-horon as well as Uzzen-sheerah. Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
25 Rephah was his son, Resheph his son, Telah his son, Tahan his son, Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef, onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
26 Ladan his son, Ammihud his son, Elishama his son, onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud, onye bụ nna Elishama.
27 Nun his son, and Joshua his son. Elishama bụ nna Nun, onye bụ nna Joshua.
28 Their possessions and settlements: Bethel with its villages, Naaran eastward, Gezer westward with its villages, Shechem with its villages, and on to Ayyah with its villages. Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha.
29 Along the borders of Manasseh's sons: Beth-shean, Taanach, Megiddo, and Dor, with their villages. Joseph son of Israel's descendants lived there. Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
30 The sons of Asher were Imnah, Ishvah, Ishvi, and Beriah; their sister was Serah. Asha mụrụ ndị a: Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
31 The sons of Beriah were Heber and Malchiel, who was the father of Birzaith. Beriya amụta ndị a: Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
32 Heber was the father of Japhlet, Shomer, and Hotham, and of their sister Shua. Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
33 The sons of Japhlet were Pasach, Bimhal, and Ashvath. These were the sons of Japhlet. Ụmụ Jaflet mụrụ bụ Pasak, Bimhal na Ashvat. Ndị a bụ ụmụ Jaflet.
34 The sons of Shemer were Ahi, Rohgah, Hubbah, and Aram. Shoma amụọ Ahi, Roga, Huba na Aram.
35 The sons of his brother Helem were Zophah, Imna, Shelesh, and Amal. Nwanne ya nwoke Helem mụrụ Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
36 The sons of Zophah were Suah, Harnepher, Shual, Beri, Imrah, Zofa amụta ndị a: Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra,
37 Bezer, Hod, Shamma, Shilshah, Ithran, and Beera. Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
38 The sons of Jether were Jephunneh, Pispa, and Ara. Jeta mụtara Jefune, Pispa na Ara.
39 The sons of Ulla were Arah, Hanniel, and Rizia. Ụla amụta Ara, Haniel na Rizia.
40 All these were Asher's descendants: heads of families, choice men, mighty warriors, heads of chiefs. Their war-service genealogy: 26,000 men. Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii (26,000), ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]