Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 16 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Korah son of Izhar, son of Kohath, son of Levi, gathered men, along with Dathan and Abiram, sons of Eliab, and On son of Peleth, sons of Reuben. Ugbu a, Kora nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, na ụfọdụ ndị agbụrụ Ruben bụ Datan, na Abiram ụmụ Eliab, na On, nwa Pelet nupuru isi
2 They stood before Moses with 250 Israelite leaders of the community—chosen assembly members, men of renown. bilie imegide Mosis. Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị Izrel.
3 They gathered against Moses and Aaron and said, "You have gone too far! The whole congregation is holy, all of them, and our Father is among them. Why do you set yourselves above our Father's assembly?" Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”
4 When Moses heard this, he fell facedown. Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala.
5 He said to Korah and all his company, "In the morning, our Father will show who is his and who is holy, and will bring that one near to himself. Whoever he chooses, he will bring near to himself. Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.
6 Do this: take censers, Korah and all your company. Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ,
7 Tomorrow put fire in them, lay incense on them before our Father. The man our Father chooses will be the holy one. You've gone too far, sons of Levi!" mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu Onyenwe anyị. Onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!”
8 Moses also said to Korah, "Listen now, you sons of Levi: Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị!
9 Is it not enough for you that the Father of Israel set you apart from the rest of Israel's congregation, to bring you near himself, to do the work of our Father's tabernacle, and stand before the congregation to serve them? Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute Onyenwe anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi?
10 He brought you near—you and all your brothers, sons of Levi—yet now you seek the priesthood too? Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja?
11 You and your whole group have gathered against our Father. Aaron—what is he, that you grumble against him?" Ọ bụ Onyenwe anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?”
12 Moses sent for Dathan and Abiram, sons of Eliab. They said, "We will not come up! Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa.
13 Is it not enough you brought us up from a land flowing with milk and honey to kill us in the wilderness, that you must also rule over us? Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị?
14 Also, you haven't brought us to a land flowing with milk and honey, or given us fields and vineyards as an inheritance. Will you gouge out these men's eyes? We won't come up!" Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!”
15 Moses was furious and said to our Father, "Disregard their offering. I haven't taken a single donkey from them, nor wronged any of them." Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.”
16 Moses told Korah, "You and your whole company, present yourselves before our Father tomorrow—you, they, and Aaron. Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
17 Each man is to take his censer, put incense on it, and bring it before our Father—250 censers—you and Aaron, each with his own censer." Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
18 Each took his censer, put fire in it and laid incense on it, and stood with Moses and Aaron at the tent of meeting's entrance. Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
19 Korah gathered the whole congregation against them at the tent of meeting's entrance; the glory of our Father appeared to the whole congregation. Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
20 And our Father spoke to Moses and Aaron, saying, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
21 "Separate yourselves from this congregation, so that I may consume them in an instant." “Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.”
22 Moses and Aaron fell facedown and cried, "O our Father, the Father of the spirits of all flesh—when one man sins, will you be angry with the whole congregation?" Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu Onyenwe anyị rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?”
23 Then our Father said to Moses, Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya,
24 "Say to the congregation: Move away from the dwellings of Korah, Dathan, and Abiram." “Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’ ”
25 So Moses got up and went to Dathan and Abiram, and the elders of Israel followed him. Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.
26 He told the congregation, "Leave the tents of these wicked men. Touch nothing of theirs, or you'll be swept away in all their sins." Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”
27 So they withdrew from the tents of Korah, Dathan, and Abiram on every side, while Dathan and Abiram came out and stood at their tent entrances with their wives, sons, and little ones. Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.
28 Moses said, "This is how you'll know our Father sent me to do all these things, and that none of it was my own idea: Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.
29 If these men die a normal death, sharing the fate of everyone, then our Father has not sent me. Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.
30 But if our Father creates something new, and the ground opens its mouth and swallows them with all that is theirs, and they go down alive into the grave, then you will know these men have despised our Father." Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.”
31 As soon as he finished saying all this, the ground beneath them split open, Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ,
32 the earth opened its mouth, swallowing them, their households, all Korah's people, and all their possessions. ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.
33 They and all who were theirs went down alive into the grave; the earth closed over them, and they were destroyed from the assembly. Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi.
34 All Israel around them fled at their cry, for they said, "The earth may swallow us too!" Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.”
35 Fire came out from our Father and consumed the 250 men offering the incense. Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
36 Not in this edition Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
37 Not in this edition “Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.
38 Not in this edition Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.”
39 Not in this edition Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja,
40 Not in this edition dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.
41 Not in this edition Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.”
42 Not in this edition Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.
43 Not in this edition Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ.
44 Not in this edition Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
45 Not in this edition “Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala.
46 Not in this edition Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.”
47 Not in this edition Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.
48 Not in this edition O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.
49 Not in this edition Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa (14,700). A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga.
50 Not in this edition Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]