Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 On that day Jesus went out of the house and sat down beside the sea. Nʼotu ụbọchị ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nʼọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala.
2 Large crowds gathered around him, so he got in a boat and sat, while the whole crowd stood on the shore. Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nʼime ụgbọ mmiri. Nʼime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nʼọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị ihe.
3 And he told them many things in parables, saying: "Look, a sower went out to sow. O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya.
4 And as he sowed, some seed fell along the path, and the birds came and devoured it. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo.
5 Other seed fell on rocky ground with little soil, and sprang up quickly since the soil lacked depth. Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi.
6 When the sun rose, the plants were scorched; since they had no root, they withered. Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala.
7 Other seed fell among thorns, and the thorns grew up and choked it. Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha.
8 Other seed fell on good soil, producing grain: some a hundredfold, some sixty, some thirty. Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị.
9 Whoever has ears, let them hear." Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
10 Then the disciples came to him and asked, "Why do you speak to them in parables?" Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nʼilu?”
11 He said, "You've been given to know the secrets of the kingdom of our Father; they have not. Ọ zaghachiri, “Nʼihi na ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze eluigwe. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya.
12 Whoever has will be given more and have plenty; whoever has none loses even what he has. Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere.
13 This is why I speak to them in parables: they look but don't see; they listen but don't hear or understand. Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu: “Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya.
14 In them Isaiah's prophecy is fulfilled: 'You will hear and hear, yet never understand; you will see and see, yet never perceive.' Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “ ‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla. Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.
15 For this people's heart has grown calloused; they hardly hear with their ears, and they have closed their eyes—otherwise they might see with their eyes, hear with their ears, understand with their heart, and turn, and I would heal them.' Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
16 But blessed are your eyes, for they see, and your ears, for they hear. Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe.
17 I assure you: many prophets and righteous people longed to see what you see, and didn't; to hear what you hear, and didn't. Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.
18 Listen, then, to the parable of the sower. “Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ.
19 Everyone who hears the kingdom's word and doesn't grasp it—the evil one comes and snatches what was sown in his heart. This is the seed sown beside the path. Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ.
20 Seed sown on rocky ground is the one who hears the word, immediately receiving it with joy, Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.
21 but having no root in themselves, they don't last; when trouble or persecution comes because of the word, they quickly fall away. Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.
22 The one sown among thorns hears the word, but worry over this age and wealth's deceit choke it, making it unproductive. Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.
23 But the seed sown on good soil hears the word and understands it. It bears fruit—100, sixty, or thirty times what was sown." Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”
24 He gave them another parable: "The kingdom of our Father is like a man who sowed good seed in his field. Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụ nʼubi ya.
25 But while everyone slept, his enemy came, sowed weeds among the wheat, and left. Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa.
26 When the wheat sprouted and produced grain, then the weeds appeared as well. Mgbe mkpụrụ ọka wiiti ndị ahụ puputara, mepụta isi ọka, ahịhịa ahụ bidokwara ito.
27 The owner's servants came saying, 'Master, didn't you sow good seed in your field? Where then did the weeds come from?' “Ndị ọrụ onye nwe ubi ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ nʼubi gị? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’
28 'An enemy did this,' he replied. 'So do you want us to go pull them up?' the servants asked him. “Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ “Ndị ọrụ ya jụrụ ya sị, ‘Ị chọrọ ka anyị gaa fopụtasịa ha?’
29 'No,' he said, 'because while you are pulling the weeds, you may uproot the wheat with them. “Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị, nʼihi na mgbe unu na-achọ ihopu ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site na-amaghị ama hopu ezi mkpụrụ ọka wiiti.
30 Let both grow together until harvest. At harvest time I'll tell the reapers: Gather the weeds first, bind them in bundles to burn; then gather the wheat into my barn.'" Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’ ”
31 He told them another parable: "The kingdom of our Father is like a mustard seed a man took and planted in his field. Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya.
32 Though the smallest of all seeds, when grown it becomes the largest of garden plants, a tree where birds come to nest in its branches." Ọ bụ ezie na ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ nʼubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
33 He gave them another parable: "The kingdom of our Father is like yeast a woman took and mixed into about twenty-five pounds of flour, until it spread through all the dough." Ọ tụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka ihe na-eko achịcha, nke nwanyị na-ewere gwakọta nʼụtụ ọka e ji eme achịcha, tutu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ niile koo.”
34 Jesus said all these things to the crowds in parables; he said nothing to them without a parable. Oge niile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu.
35 This fulfilled what was spoken through the prophet: "I will open my mouth in parables; I will utter what's been hidden since the world was founded." O mere nke a ka okwu onye amụma kwuru mezuo, sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọbụla na-amaghị site nʼoge e kere ụwa.”
36 Then he left the crowds and entered the house. His disciples approached him and said, "Explain to us the parable of the weeds in the field." Emesịa, ọ hapụrụ igwe mmadụ ahụ baa nʼụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nʼubi a kụrụ ọka.”
37 He answered, "The one who sowed the good seed is the Son of Man. Jisọs zara ha sị, “Nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke Mmadụ.
38 The field is the world. The good seed is the kingdom's children; the weeds are the evil one's children. Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ.
39 The enemy who sowed them is the devil; the harvest is the end of the age; the harvesters are angels. Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi.
40 As the weeds are gathered and burned in fire, so it will be at the end of the age. “Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ.
41 The Son of Man will send his angels to weed out of his kingdom everything that causes sin and all who do evil. Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe.
42 They will throw them into the blazing furnace, where there is weeping and grinding of teeth. Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.
43 Then the righteous will shine like the sun in their Father's kingdom. The one with ears should listen." Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
44 The kingdom of our Father is like treasure hidden in a field. A man found it, hid it again, then joyfully sold all he had to buy that field. “Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ.
45 "Again, the kingdom of our Father is like a merchant searching for fine pearls. “Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.
46 Finding one priceless pearl, he went and sold all he had and bought it. Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa.
47 Again, our Father's kingdom is like a net cast into the lake, gathering fish of every kind. “Ọzọkwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke a wụnyere nʼime osimiri, jiri ya jide azụ dị iche iche.
48 When full, the fishermen pulled it ashore, sat down, and collected the good fish in baskets, throwing out the bad. Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma.
49 So it will be at the age's end: angels will go out and separate the wicked from among the righteous, Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume,
50 and throw them into the blazing furnace, where they will weep and grind their teeth." ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.”
51 "Have you understood all these things?" "Yes," they replied. Ọ jụrụ ha sị, “Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha zara sị ya, “E.”
52 He said to them, "Every teacher of the law trained for our Father's kingdom is like a homeowner who brings treasures new and old out of his storeroom." Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”
53 When Jesus had finished these parables, he moved on from there. Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ.
54 Returning to his hometown, he taught in their synagogue, and they were amazed: "Where does this man get this wisdom and these mighty works? O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile?
55 Isn't this the carpenter's son? Isn't his mother named Mary, and his brothers James, Joseph, Simon, and Judas? Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom?
56 Aren't all his sisters here with us? Where then did this man get all these things?" Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?”
57 They took offense at him. But Jesus said to them, "A prophet is honored everywhere except in his hometown and in his own household." Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.”
58 He didn't do many miracles there because of their lack of faith. Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]