Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Matthew 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 At that time Jesus went through the grainfields on the Sabbath. His disciples were hungry and began to pluck heads of grain and eat them. Nʼoge ahụ, Jisọs sitere nʼubi a kụrụ ọka na-agafe nʼụbọchị izuike. Ma ebe agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ịghọ ogbe ọka, na ịta mkpụrụ ya.
2 Seeing this, the Pharisees said to him, "Look—your disciples are doing what's unlawful on the Sabbath." Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi ime nʼụbọchị izuike!”
3 He said to them, "Haven't you read what David did when he and his companions were hungry?" Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid na ndị ya na ha soo mere mgbe agụụ na-agụ ha?
4 how he entered the house of our Father and ate the Presence bread, unlawful for him and his companions, reserved only for priests? Otu o si banye nʼụlọ Chineke, ya na ndị so ya, rie achịcha a na-eche nʼihu Chineke, nke na-ezighị ezi nʼiwu ka ha rie, kama ọ dịịrị naanị ndị nchụaja iri ya.
5 "Or haven't you read in the Law that on the Sabbath, priests in the temple break the Sabbath and are guiltless? Ka ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nʼime akwụkwọ iwu Mosis na ndị nchụaja na-emerụ ụbọchị izuike nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma ọ dịghị onye na-ata ha ụta?
6 I tell you, something greater than the temple is here. Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọnsọ ukwu nọ nʼebe a.
7 If you knew what 'I want mercy, not sacrifice' means, you wouldn't have condemned the blameless. Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.
8 For the Son of Man is Lord of the Sabbath." Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izuike.”
9 He went on from there and entered their synagogue. O sitere nʼebe ahụ pụọ banye nʼụlọ nzukọ ha.
10 A man with a withered hand was there. They asked him, "Is it lawful to heal on the Sabbath?"—hoping to accuse him. Nʼebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nʼebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ mmadụ nʼụbọchị izuike?”
11 He said to them, "Who among you with a sheep, if it falls in a pit on the Sabbath, won't grab and pull it out? Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu nwere otu atụrụ danyere nʼime olulu nʼụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ahapụ ya nʼebe ahụ? Ọ gaghị ejide ya dọpụta ya?
12 How much more is a person worth than a sheep! So it's lawful to do good on the Sabbath." Mmadụ ọ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, o ziri ezi nʼiwu bụ ịrụ ọrụ ọma nʼụbọchị izuike.”
13 Then he told him, "Stretch out your hand." He stretched it out, and it was restored, healthy like the other. Mgbe ahụ ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.
14 But the Pharisees went out and plotted how to destroy him. Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
15 Jesus, aware of this, withdrew from there. And many followed him, and he healed them all, Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile.
16 and he ordered them not to tell anyone about him. Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ.
17 This was to fulfill what was spoken by the prophet Isaiah: Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru,
18 "Look, my servant—Jesus—whom I have chosen, my beloved in whom my soul delights. I will put my Spirit upon him, and he will proclaim justice to the nations. “Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
19 He will not quarrel or shout, nor will anyone hear his voice in the streets. Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi.
20 A bruised reed he will not break, and a smoldering wick he will not quench, until he brings justice to victory; Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị, tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie.
21 and in his name the nations will put their hope." Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”
22 Then someone brought him a blind, mute demon-oppressed man, and he healed him so the man could speak and see. Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu.
23 And all the crowds were amazed and said, "Can this be the Son of David?" Ihe a juru igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ anya. Nʼihi ya, ha kwuru sị, “Nwoke a, ọ ga-abụ Nwa Devid?”
24 But hearing this, the Pharisees said, "This man drives out demons only by Beelzebul, prince of demons." Mgbe ndị Farisii nụrụ nke a, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nʼihi na Belzebub, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.”
25 Knowing their thoughts, he said to them, "Every kingdom divided against itself is ruined, and no city or house divided against itself will stand. Ma ebe ọ matara ihe ha na-eche nʼobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Alaeze ọbụla kewara megide onwe ya ga-ada. Obodo o bụla maọbụ ezinaụlọ ọbụla kewara megide onwe ya agaghị eguzo.
26 And if Satan casts out Satan, he is divided against himself. How then will his kingdom stand? Ọ bụrụ na ekwensu achụpụ ekwensu, o kewala megide onwe ya. Oleekwanụ otu alaeze ya ga-esi guzo.
27 If I drive out demons by Beelzebul, by whom do your sons drive them out? So they will be your judges. Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub, ọ bụ nʼike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nʼihi okwu a unu kwuru.
28 But if I drive out demons by the Spirit of our Father, then the kingdom of our Father has reached you. Ma ọ bụrụ na m na-esite nʼike Mmụọ nke Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nʼetiti unu.
29 Or how can someone enter a strong man's house and carry off his goods, unless he first restrains the strong man? Then he can loot his house. “Ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo niile dị nʼụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ? Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo niile dị nʼụlọ nwoke ahụ.
30 Whoever is not with me is against me, and whoever does not gather with me scatters. “Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
31 So I tell you, every sin and blasphemy will be forgiven people, but blasphemy against the Spirit will not be forgiven. Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmehie na nkwulu niile. Ma agaghị agbaghara nkwulu ekwuluru Mmụọ Nsọ.
32 Whoever speaks against the Son of Man will be forgiven; whoever speaks against the Holy Spirit won't be forgiven—neither in this age nor the age to come. Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa.
33 Make the tree good and its fruit good, or the tree bad and its fruit bad, for a tree is known by its fruit. “Ọ bụrụ na e mee ka osisi too nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọma, ma ọ bụrụ na o toghị nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọjọọ. Nʼihi na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya.
34 You brood of vipers! How can you speak good things since you're evil? For the mouth speaks the heart's overflow. Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta.
35 A good person produces good from a good treasure; an evil person produces evil from an evil treasure. Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe.
36 I tell you, on judgment day people will answer for every careless word they speak, Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru.
37 for by your words you will be justified, and by your words you will be condemned." Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”
38 Then some scribes and Pharisees said, "Teacher, we want a sign from you." Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, “Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama.”
39 He answered, "This evil, adulterous generation demands a sign. None will be given it except the sign of the prophet Jonah. Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụ naanị ajọ ọgbọ nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịbama. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịbama Jona onye amụma.
40 As Jonah was three days and three nights in the great fish's belly, so the Son of Man will be three days and three nights in the earth's heart. Nʼihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼafọ azụ dị ukwuu, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼobi nke ala.
41 Ninevites will rise at the judgment with this generation and condemn it, for they repented at Jonah's preaching, and something greater than Jonah is here. Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe. Nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona. Ma lee onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.
42 The queen of the South will rise at the judgment with this generation and condemn it, for she came from earth's ends to hear Solomon's wisdom—and look, something greater than Solomon is here. Nʼụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị nke Ndịda ga-eso ọgbọ a bilie boo ya ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nʼihi na o siri nʼebe dị ụwa sọtụrụ bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nʼebe a, ma unu jụrụ i kwere na ya.
43 When an unclean spirit leaves a person, it travels through dry places seeking rest, and finds none. “Mgbe mmụọ na-adịghị ọcha si nʼime mmadụ pụọ, ọ na-agabiga nʼọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe izuike, ma ọ naghị achọta ya.
44 Then it says, 'I will return to my house I left.' Coming, it finds it empty, swept, and put in order. Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m, ebe m si pụta.’ Mgbe ọ lọghachiri, ọ na-achọpụta na a zachara ụlọ ahụ dozie ya, ọ dịkwaghị onye bichiri nʼime ya.
45 Then it goes and brings along seven other spirits more evil than itself; they enter and settle there, and that person ends up worse off than before. So it will be with this evil generation." Mgbe ahụ, ọ na-apụ gaa chọta mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha niile na-abata bịa biri nʼime onye ahụ. Mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị ndị bi nʼọgbọ a jọrọ njọ.”
46 While he was still speaking to the crowds, his mother and brothers stood outside, wanting to speak with him. Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu.
47 Someone told him, "Look, your mother and your brothers are standing outside, wanting to speak to you." Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ gwara ya okwu sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na-achọ ịhụ gị nʼezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.”
48 He answered the one who told him, "Who is my mother, and who are my brothers?" Ma ọ zara onye ahụ gwara ya okwu sị, “Onye bụ nne m? Olee ndị bụ ụmụnne m ndị nwoke?”
49 And stretching out his hand toward his disciples, he said, "Here are my mother and my brothers! Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka, sị, “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke.
50 For whoever does the will of my Father in heaven is my brother and sister and mother." Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe Nna m bi nʼeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, nakwa nne m.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]