Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 49 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jacob called his sons and said, "Gather, so I can tell you what will happen to you in the days ahead. Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu.
2 Assemble and listen, sons of Jacob; listen to Israel your father. “Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.
3 Reuben, you are my firstborn, my might and the firstfruits of my strength, excelling in dignity and excelling in power. “Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.
4 Unstable as water, you will not excel, because you went up to your father's bed; then you defiled it—he went up to my couch. Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.
5 Simeon and Levi are brothers; weapons of violence are their swords. “Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.
6 May I never enter their council; may my honor not be joined to their assembly. For in their anger they killed men, and in their willfulness they hamstrung oxen. Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.
7 Cursed be their anger, for it is fierce, and their wrath, for it is cruel! I will divide them throughout Jacob and scatter them throughout Israel. Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.
8 Judah, your brothers will praise you; your hand will be on the neck of your enemies; your father's sons will bow down before you. “Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.
9 Judah is a lion's cub; from the prey, my son, you have come back. He stooped down; he crouched as a lion and as a lioness—who dares rouse him? Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
10 The scepter will not depart from Judah, nor the ruler's staff from between his feet, until he comes to whom it belongs, and to him will be the obedience of the peoples. Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.
11 Binding his foal to the vine and his donkey's colt to the choice vine, he has washed his garments in wine and his robes in the blood of grapes. Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
12 His eyes are darker than wine, and his teeth whiter than milk. Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.
13 Zebulun will dwell at the shore of the sea; he will become a haven for ships, and his border will be at Sidon. “Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.
14 Issachar is a strong donkey, crouching between the sheepfolds. “Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ.
15 He saw that a resting place was good and that the land was pleasant, so he bent his shoulder to the load and became a servant at forced labor. Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma, hụ otu ala ya si maa mma, ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ; were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike.
16 Dan will judge his people as one of the tribes of Israel. “Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel.
17 Dan will be a serpent in the road, a viper by the path, that bites the horse's heels so that his rider falls backward. Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ, dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa, nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ.
18 I wait for your salvation, my Father. “O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.
19 Gad—raiders will raid him, but he will raid at their heels. “Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị, ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ.
20 Asher's food will be rich, and he will yield royal delicacies. “Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba, nke na-adị ndị eze mma.
21 Naphtali is a doe let loose that bears beautiful fawns. “Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ, nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma.
22 Joseph is a fruitful branch, a fruitful branch by a spring; his branches run over the wall. “Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi, na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị.
23 The archers bitterly attacked him, shot at him, and harassed him severely. Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha, ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị.
24 Yet his bow remained unmoved; his arms were made agile by the hands of the Mighty One of Jacob—our Father—from there comes the Shepherd, the Stone of Israel. Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba, ike agwụghị ogwe aka ya, nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb, nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel,
25 By the God of your father who will help you, by El Shaddai—the Almighty, our Father—who will bless you with blessings of heaven above, blessings of the deep that crouches beneath, blessings of the breasts and of the womb. nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa.
26 The blessings of your father are mighty beyond the blessings of my ancestors, reaching to the riches of the everlasting hills. May they be on the head of Joseph, and on the brow of him who was set apart from his brothers. Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya.
27 Benjamin is a ravenous wolf, in the morning devouring the prey and at evening dividing the spoil." “Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.”
28 All these are the twelve tribes of Israel; this is what their father said as he blessed them, each with the blessing fitting him. Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.
29 He commanded them: "I am being gathered to my people. Bury me with my fathers in the cave in Ephron the Hittite's field, Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het.
30 in the cave in the field at Machpelah, east of Mamre in Canaan, which Abraham bought along with the field from Ephron the Hittite as a burial place. Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu.
31 There they buried Abraham and Sarah his wife; there they buried Isaac and Rebekah his wife; and there I buried Leah, Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa.
32 the field and the cave that is in it were bought from the Hittites. Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”
33 Jacob finished commanding his sons, drew his feet into the bed, breathed his last, and was gathered to his people." Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]