Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When Abram was ninety-nine years old, our Father appeared to him and said, "I am El Shaddai—your Father Almighty. Walk before me and be blameless. Mgbe Ebram gbara iri afọ itoolu na itoolu, Onyenwe anyị gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla.
2 And I will make my covenant between me and you, and I will multiply you exceedingly." Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị nʼetiti mụ na gị, mekwa ka ị mụbaa nke ukwuu nʼọnụọgụgụ.”
3 Then Abram fell on his face, and our Father spoke with him, saying: Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị,
4 "As for me, my covenant is with you, and you will become father of a multitude of nations. “Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba.
5 Your name will no longer be Abram, but Abraham, for I have made you father of a multitude of nations. Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.
6 I will make you extremely fruitful; I will turn you into many nations, and kings will come from you. Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta.
7 I will establish my covenant between me and you and your descendants after you, for all generations—an everlasting covenant—to be Father to you and your descendants after you. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị.
8 I will give you and your descendants after you the land where you live as a foreigner—all the land of Canaan—as an eternal possession; and I will be their Father." Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.”
9 Then our Father said to Abraham, "As for you: keep my covenant, you and your children after you, throughout their generations. Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile.
10 This is my covenant to keep, between me and you and your descendants after you: every male among you must be circumcised. Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu.
11 Circumcise the flesh of your foreskin; it will be the sign of the covenant between me and you. A ga-ebi unu ugwu, bipụ elu ahụ nke anụ ahụ unu. Nke a ga-abụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na unu.
12 Every male among you, generation after generation, must be circumcised at eight days old—whether born in your house or bought with silver from a foreigner not your own offspring. Nʼoge ọ gbara mkpụrụ ụbọchị asatọ, unu ga-ebi nwoke ọbụla nʼagbụrụ unu ugwu: ndị a mụrụ nʼụlọ, maọbụ ndị eji ego zụta site nʼaka ndị mba ọzọ, ndị na-esighị na mkpụrụ nke afọ gị.
13 Everyone born in your house or bought with your money must be circumcised. My covenant will be in your flesh, an everlasting covenant. A ga-ebi ha niile ugwu. Ma a mụrụ ha nʼezinaụlọ gị ma i ji ego zụta ha site nʼaka onye mba ọzọ. Ọgbụgba ndụ m nke ga-apụta ihe nʼanụ ahụ gị bụ ọgbụgba ndụ ebighị ebi.
14 Any uncircumcised male not circumcised in his foreskin's flesh will be cut off from his people—he has broken my covenant." Nwoke ọbụla a na-ebighị ugwu nke anụ ahụ ka a ga-ebipụ site nʼetiti ụmụnna ya. Nʼihi na o mehiela megide ọgbụgba ndụ m.”
15 Then our Father said to Abraham, "Don't call your wife Sarai anymore—her name is Sarah. Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera.
16 I will bless her and indeed give you a son by her. I will bless her—she will become nations; kings of peoples will come from her." Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta.”
17 Abraham fell on his face, laughing, and said to himself, "Can a son be born to a man who is one hundred years old? Can ninety-year-old Sarah give birth?" Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?”
18 Then Abraham said to our Father, "If only Ishmael might live in your presence!" Ebraham gwara Chineke sị, “A sịkwa na ị ga-ekwe mee ka Ishmel bụrụ onye dị ndụ nʼihu gị.”
19 But our Father said, "No, your wife Sarah will bear you a son, and you will name him Isaac. I will confirm my covenant with him, an everlasting covenant for his descendants after him. Ma Chineke zara sị ya, “Ee, kama Sera nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Ị ga-agụ ya Aịzik. Ọgbụgba ndụ m ga-adịkwara ya na agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
20 As for Ishmael, I have heard you. I will bless him, make him fruitful, and multiply him exceedingly. He will father twelve leaders, and I will make him into a great nation. Ma banyere Ishmel, anụla m ihe i kwuru. Aga m agọzi ya mee ya ka ọ baa ụba ma dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-aghọ nna ndị eze iri na abụọ. Aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.
21 But I will confirm my covenant with Isaac, whom Sarah will bear you at this time next year." Ma ọgbụgba ndụ m ka m ga-eme ka o guzosie ike nʼebe Aịzik nọ, onye Sera ga-amụtara gị nʼoge dịka ugbu a nʼafọ ọzọ.”
22 When he had finished speaking with Abraham, our Father went up from him. Mgbe ọ gwasịrị Ebraham okwu, Chineke si nʼebe ọ nọ pụọ.
23 Then Abraham took Ishmael his son, everyone born in his household, and everyone bought with his money—every male in Abraham's household—and circumcised the flesh of their foreskins that very day, as our Father had told him. Nʼụbọchị ahụ, Ebraham duuru Ishmel nwa ya nwoke, na ndị ikom niile a mụrụ nʼezinaụlọ ya, tinyere ndị e ji ego zụta, ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya, bie ha ugwu dịka Chineke gwara ya ka ọ mee.
24 Abraham was ninety-nine years old when he was circumcised in the flesh of his foreskin. Ebraham gbara iri afọ itoolu na itoolu mgbe e biri ya ugwu,
25 His son Ishmael was thirteen when he was circumcised in the flesh of his foreskin. Ishmel nwa ya gbara afọ iri na atọ.
26 On that very day Abraham and Ishmael his son were circumcised. E biri Ebraham na nwa ya bụ Ishmel ugwu nʼotu ụbọchị ahụ.
27 All the men of his household—house-born and bought with silver from a foreigner—were circumcised with him. Ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ Ebraham, ndị a mụrụ nʼụlọ ya na ndị e si nʼaka ndị mba ọzọ zụta ka e biri ugwu nʼoge Ebraham biri ugwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]