Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 16 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Sarai, Abram's wife, had borne him no children. She had an Egyptian servant named Hagar. Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega.
2 Sarai told Abram, "Look, our Father has kept me from bearing children. Go sleep with my servant; maybe I'll build a family through her." Abram did as Sarai said. Ya mere ọ gwara Ebram sị, “Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ. Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m.” Ebram kweere ihe Serai kwuru.
3 After Abram had lived in Canaan ten years, Sarai his wife took her Egyptian servant Hagar and gave her to her husband Abram as a wife. Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan.
4 He slept with Hagar; she conceived, and seeing she was pregnant, she despised her mistress. Ebram na Hega dinara. Hega tụụrụ ime. Ma mgbe Hega matara na ọ dịrịla ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu bụ Serai anya.
5 Sarai said to Abram, "My wrong is on you. I gave my servant into your arms; now she sees she's pregnant, she despises me. May our Father judge between me and you." Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”
6 Abram told Sarai, "Your servant is in your hands; do to her what seems good to you." Sarai mistreated her, and she fled from her presence. Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
7 The messenger of our Father found Hagar at the wilderness spring, the spring on the way to Shur. Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua,
8 "Hagar, Sarai's servant," he said, "where have you come from, and where are you going?" "I'm running away from my mistress Sarai," she replied. jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?” Hega zara sị, “Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ.”
9 "Go back to your mistress," the messenger of our Father told her, "and submit to her authority." Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.”
10 The messenger of our Father told her, "I will multiply your descendants until they can't be counted." Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịkwa ya, “Aga m amụba ụmụ gị, ka a hapụ inwe ike ịgụta ole ha dị.”
11 The messenger of our Father also said to her: "You are now pregnant and will give birth to a son. You will name him Ishmael, for I have heard of your misery. Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Ị dị ime ugbu a, ị ga-amụ nwa nwoke. Aha ị ga-agụ ya bụ Ishmel nʼihi na Onyenwe anyị anụla maka nhụju anya gị.
12 He will be a wild donkey of a man, his hand against everyone and everyone's hand against him, and he will live in hostility toward all his brothers." Nwoke dịka ịnyịnya ibu a na-azụghị azụ ka ọ ga-abụ. Ọ ga-emegide onye ọbụla, onye ọbụla ga-emegidekwa ya. Ọ ga-ebi nʼime ibu iro, megide ụmụnna ya niile.”
13 She named our Father who spoke to her, "You are El Roi—my God who sees me," for she said, "I have now seen the One who sees me." Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.”
14 That is why the well was called Beer-lahai-roi; it lies between Kadesh and Bered. Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị. Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered.
15 So Hagar bore Abram a son, and Abram named the son she had borne Ishmael. Emesịa, Hega mụtaara Ebram nwa nwoke. Ebram kpọrọ nwa nwoke ahụ Hega mụtaara ya Ishmel.
16 Abram was eighty-six years old when Hagar bore him Ishmael. Ebram gbara iri afọ asatọ na isii mgbe Hega mụtaara ya Ishmel.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]