Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Deuteronomy 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 We turned and took the road to Bashan, and Og king of Bashan, with all his people, came out to fight us at Edrei. Ihe ọzọ bụ na anyị chigharịrị, gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, ya na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụta izute anyị nʼagha na Edrei.
2 And our Father told me, "Don't fear him, for I've given him, all his people, and his land to you; do to him as you did to Sihon king of the Amorites, who lived at Heshbon." Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.”
3 So our Father also gave us Og king of Bashan and all his people, and we struck them down, leaving no survivor. Ya mere, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ.
4 At that time we captured all his cities—all sixty, none untaken—the whole region of Argob, Og's kingdom in Bashan. Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan.
5 All these were cities fortified with high walls and barred gates, besides a great many unwalled villages. Obodo ndị a bụ obodo e wusiri ike, nwechara mgbidi dị elu nke ukwuu, nwekwaa ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. Anyị lụgbukwara ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ, ndị na-enweghị mgbidi.
6 We devoted them to destruction, as with Sihon king of Heshbon, devoting to destruction every city—its men, women, and children. Anyị bibiri ihe niile dị nʼobodo Bashan, dịka anyị mere nʼobodo Saịhọn, eze Heshbọn. Anyị gburu mmadụ niile bi nʼime ha, nwoke, nwanyị, na ụmụntakịrị.
7 But all the livestock and the plunder of the cities we took as spoil for ourselves. Ma anụ ụlọ ha niile, na ihe nkwata si nʼobodo ha niile, bụ ihe anyị lụtara nʼagha nye onwe anyị.
8 So at that time we took the land from these two Amorite kings across the Jordan, from the Arnon Valley to Mount Hermon. Mgbe ahụ, anyị napụrụ ala ahụ site nʼaka eze abụọ ndị Amọrait, ya bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha dị site na ndagwurugwu Anọn ruo nʼugwu Hemon.
9 (the Sidonians call Hermon Sirion, while the Amorites call it Senir), (Aha ndị Saịdọn na-akpọ ugwu Hemon bụ Siriọn, ma ndị Amọrait na-akpọ ya Senia.)
10 all plateau cities, all Gilead, all Bashan to Salecah and Edrei—Og's kingdom cities in Bashan. Anyị meriri obodo ndị ahụ niile dị nʼala dị larịị, meriekwa Gilead niile na Bashan, tutu ruo obodo Saleka na Edrei, obodo ndị dị nʼalaeze Ọg, eze Bashan.
11 (Only Og king of Bashan was left of the Rephaim's remnant. His bed was an iron bed; isn't it in Rabbah of the Ammonites? It was about thirteen and a half feet long and six feet wide.). (Ọg, eze ndị Bashan bụ naanị onye fọdụrụ ndụ nʼagbụrụ ndị Refaim. E ji igwe kwaa ihe ndina ya, nke ogologo ya dị mita anọ, nke obosara ya bụkwa mita abụọ. Ihe ndina a dị ruo taa nʼobodo Raba, otu nʼime obodo ndị Amọn.)
12 This land we took then: from Aroer on the Arnon Valley's edge, plus half the Gilead hill country and its cities, I gave to the Reubenites and Gadites. Mgbe anyị nwetara ala ndị a, eweere m ya nye ndị Ruben, na Gad, ya bụ, oke ala dị nʼebe obodo ugwu Aroea, nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn. Tinyekwara ọkara obodo ugwu Gilead, na obodo niile dị nʼime ya.
13 I gave the rest of Gilead and all Bashan—Og's kingdom—to the half-tribe of Manasseh: the whole region of Argob. (All that part of Bashan was called the land of the Rephaim. Ala fọdụrụ na Gilead nakwa Bashan niile na alaeze Ọg ka m nyere otu ọkara ebo Manase. Nke a bụ ala Agob niile dị na Bashan, bụ ndị amaara dịka ala ndị Refaim.
14 Jair son of Manasseh took the whole region of Argob to the Geshurite and Maacathite border, and named Bashan after himself, Havvoth-jair, to this day.). Jaịa, onye si nʼebo Manase, were ala niile dị nʼAgob, ọ bụladị ruo nʼoke ala ndị Geshua na ndị Maaka. Ọ kpọrọ ya nʼaha ya, nke mere na ruo taa ihe a na-akpọ Bashan bụ Havọt Jaịa, nke pụtara, obodo Jaịa.
15 And to Machir I gave Gilead. Makia ka m nyere Gilead.
16 To the Reubenites and Gadites I gave from Gilead to the Arnon Valley—its middle the border—to the Jabbok River, the Ammonites' border. Ma Ebo Ruben na Gad ka m nyere ala niile dị site na Gilead ruo nʼetiti ndagwurugwu Anọn, na site na ndagwurugwu a ruo nʼiyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Etiti ndagwurugwu Anọn bụkwa oke ala ebo Ruben na Gad.
17 Also the Arabah, the Jordan its border, from Chinnereth to the Sea of the Arabah (the Dead Sea), below Pisgah's slopes, eastward. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ osimiri Jọdan nke dị nʼAraba. Oke ala a sitere na Kineret gbatịa ruo nʼOsimiri Araba (ya bụ Osimiri Nnu), nke dị na mgbada ugwu Pisga.
18 At that time I ordered you: "Your Father gave you this land to possess; all your fighting men must cross armed ahead of your brothers, the Israelites. Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu.
19 Only your wives, children, and livestock—I know you have much livestock—stay in the cities I gave you, Otu ọ dị, ebe ọ bụ na unu nwere ọtụtụ anụ ụlọ, ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu ga-ebi nʼobodo ndị m nyere unu, lekọtaa anụ ụlọ unu anya,
20 until our Father gives your brothers rest as he has you, and they too take the land your Father is giving them beyond the Jordan. Then each of you returns to the possession I gave you." tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-enye ụmụnna unu mmeri dịka o nyere unu. Mgbe ha nwetara ala Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye ha nʼofe Jọdan, onye ọbụla nʼime unu nwere ike lọghachi bịa biri nʼala unu.”
21 I commanded Joshua then: "Your own eyes saw all your Father did to these two kings. Your Father will do so to all the kingdoms you're crossing into. Nʼoge ahụ, agwara m Joshua okwu sị, “I jirila anya gị hụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere eze abụọ ndị a. Otu a ka ọ ga-emekwa alaeze niile dị nʼofe Jọdan ebe unu na-aga.
22 Don't be afraid of them, for your Father himself fights for you." Atụla ha egwu, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị ga-alụrụ gị ọgụ.”
23 And I pleaded with our Father at that time, saying, Nʼoge ahụ, arịrịọ m Onyenwe anyị arịrịọ sị ya,
24 "My Sovereign Father, you've begun showing your servant your greatness and strong hand. What god in heaven or earth can do deeds and mighty acts like yours? “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị malitela igosi mụ bụ ohu gị ịdị ukwuu gị na ike gị. O nweghị chi ọzọ dị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa pụrụ ịrụ ọrụ ebube niile ị rụrụ.
25 Please let me cross over and see the good land beyond the Jordan, this good highland, and Lebanon." Kwere ka m gafee hụ ala ọma ahụ dị nʼofe ọzọ nke Jọdan, ala ugwu ugwu ahụ mara mma, na Lebanọn.”
26 But our Father was angry with me because of you and would not listen to me; our Father said to me, "Enough! Don't speak to me about this again. Ma nʼihi unu, Onyenwe anyị wesoro m iwe jụ ige m ntị! Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “O zuola! Agwakwala m ihe ọbụla banyere okwu a.
27 Climb Pisgah's summit, raise your eyes west, north, south, and east, and see with your own eyes, for you won't cross this Jordan. Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
28 But commission Joshua, encourage and strengthen him, for he will cross ahead of this people and give them the land you will see as their inheritance." Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume, nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.”
29 So we remained in the valley opposite Beth-peor. Ya mere, anyị nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dị nso na Bet-Peoa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]