Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Deuteronomy 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then we turned and traveled toward the wilderness by way of the Red Sea, as our Father told me, and circled Mount Seir for many days. Anyị laghachiri azụ chee ihu nʼọzara nʼụzọ gawara Osimiri Uhie, dịka Onyenwe anyị gwara m. Ọtụtụ afọ ka anyị nọ na-awagharị gburugburu ugwu Sia.
2 Then our Father said to me, Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m,
3 "You have gone around this hill country long enough. Turn northward. “Unu agbaala ala ugwu ugwu a gburugburu ogologo oge, cheenụ ihu nʼakụkụ ugwu.
4 Command the people: You are crossing the territory of your brothers, Esau's descendants, who live in Seir. They will fear you—be very careful. Nye ụmụ Izrel iwu ndị a: ‘Unu ga-aga site nʼala ụmụnna unu ndị Edọm gafee. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, onye biri na Sia. Ha ga-atụ egwu mgbe ha nụrụ na unu ga-esi nʼala ha gafee, ma kpachapụnụ anya.
5 Do not provoke them; I will not give you any of their land, not even a footstep's width, since I have given Mount Seir to Esau as his possession. Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya.
6 Buy food from them for silver to eat, and also buy water from them for silver to drink. Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’ ”
7 "For your Father has blessed you in all the work of your hands. He has known your journey through this great wilderness. These forty years your Father has been with you; you have lacked nothing." Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu.
8 So we passed by our brothers, the descendants of Esau who live in Seir, away from the Arabah road that comes up from Elath and Ezion-geber. Then we turned and went on toward the wilderness of Moab. Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab.
9 And our Father said to me, "Do not harass Moab or provoke them to battle, for I will not give you any of their land as a possession, since I have given Ar to Lot's descendants as a possession." Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.”
10 (The Emim formerly lived there, a large and powerful people, as tall as the Anakim. (Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak.
11 Like the Anakim, they too are counted as Rephaim, but the Moabites call them Emim. A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim.
12 Horites once lived in Seir, but Esau's descendants drove out and destroyed them, settling in their place—just as Israel did in the land our Father gave them.). Ma mgbe gara aga ọ bụ ndị Hor bi na Sia, ma ndị Edọm, ụmụ Ịsọ, chụpụrụ ha. Ha bibiri ndị Hor bichikwaa ala ha, dịka ụmụ Izrel si bichie nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha dịka ihe nketa.)
13 Now get moving and cross the Wadi Zered." So we crossed the Wadi Zered. Onyenwe anyị gwara anyị okwu sị, “Ugbu a bilienụ, gafee Ndagwurugwu Zered.” Anyị bilikwara gafee.
14 From Kadesh-barnea to crossing the Wadi Zered took thirty-eight years, until the whole generation of fighting men had died out of the camp, as our Father had sworn to them. Iri afọ atọ na asatọ gasịrị, site na mgbe anyị hapụrụ Kadesh Banea ruo mgbe anyị gafere Ndagwurugwu Zered! Nʼoge a, ọgbọ ndị ikom ahụ niile na-alụ agha anwụchaala site nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị ṅụrụ ha nʼiyi.
15 Indeed, the hand of our Father was against them, rooting them out from the camp until they perished. E, aka Onyenwe anyị dị megide ha, ruo mgbe o mere ka ha niile nwụchaa site nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ.
16 So when all the fighting men had finally perished and died from among the people, Mgbe onye nke ikpeazụ nʼime ndị niile a tozuru ije agha nwụchara,
17 our Father said to me, Onyenwe anyị sịrị m,
18 "Today you are to cross the boundary of Moab at Ar. “Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab.
19 When you come near the Ammonites, do not attack or provoke them, for I will not give you any of their land as a possession—I gave it to Lot's descendants as their possession." Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.”
20 (That too counts as Rephaim land—Rephaim lived there before, though Ammonites call them Zamzummim, Ndị bi nʼebe a na mbụ bụ ndị Refaim, ma ụmụ Amọn na-akpọ ha ndị Zamzum.
21 a large and powerful people, tall as the Anakim. But our Father destroyed them before the Ammonites, who drove them out and settled in their place, Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha.
22 as he did for Esau's descendants living in Seir, when he destroyed the Horites before them; they drove them out and settled in their place, remaining to this day. Onyenwe anyị mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa.
23 The Avvim lived in villages as far as Gaza; Caphtorim, who came from Caphtor, destroyed them and settled in their place.). Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza.
24 "Set out and cross the Wadi Arnon. Look, I have given Sihon the Amorite, king of Heshbon, and his land into your hand. Begin to take possession—engage him in battle. Emesịa, Onyenwe anyị sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu.
25 Today I will begin putting dread and fear of you on every people under heaven. They will hear the report of you, tremble, and writhe in anguish because of you." Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.”
26 I sent messengers from the wilderness of Kedemoth to Sihon king of Heshbon with words of peace, saying, Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị,
27 "Let me pass through your land. I will stay only on the road, turning aside neither right nor left. “Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
28 Sell me food for money to eat, give me water for money to drink—only let me pass through on foot, Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala,
29 as Esau's descendants who live in Seir and the Moabites who live in Ar did for me, until I cross the Jordan into the land our Father is giving us." dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.”
30 But Sihon king of Heshbon refused to let us pass, for our Father hardened his spirit and stiffened his heart, to hand him over to you, as he has done this day. Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a.
31 And our Father said to me, "Look, I've begun giving you Sihon and his land. Begin now taking possession—possess his land." Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.”
32 Then Sihon came out against us, he and all his people, to fight at Jahaz. Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz,
33 And our Father gave him to us, and we struck him down, his sons, and all his people. Onyenwe anyị Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile.
34 At that time we captured all his cities and completely destroyed every city—men, women, children—leaving no survivor. Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ.
35 We plundered only the livestock for ourselves, plus the spoil of the cities we captured. Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata.
36 From Aroer on the Wadi Arnon's edge, and from the town in the valley, to Gilead, no town was too strong for us; Our Father gave them all to us. Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị.
37 But you did not go near the Ammonites' land, all along the banks of the Wadi Jabbok and the hill country's towns, just as our Father commanded us. Ma dịka usoro iwu Onyenwe anyị Chineke anyị si dị, anyị abanyeghị ala ndị Amọn ọbụla maọbụ ruokwa nʼala dị nʼakụkụ iyi Jabọk nso, maọbụ nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼugwu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]