Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Romans 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 I speak truth in Christ, not lying—my conscience testifies with me in the Holy Spirit, Ana m ekwu eziokwu nʼime Kraịst. Anaghị m ekwu okwu ụgha. Akọnuche m nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbakwara m ama.
2 that I have great sorrow and unceasing anguish in my heart. A nọ m nʼọnọdụ oke ihe mwute na ihe mgbu dị ukwuu nʼobi m.
3 I could wish myself cursed, cut off from Christ, for my brothers and sisters, my own people by blood. A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye a bụrụ ọnụ na onye e wepụrụ site nʼebe Kraịst nọ nʼihi ụmụnna m na ndị ikwu m,
4 They are Israelites: theirs the full rights as sons, the glory, the covenants, the lawgiving, the worship, the promises. bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche.
5 The ancestors are theirs; from them, by human descent, comes the Christ, who is God over all, blessed forever. Amen. Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
6 This doesn't mean our Father's word has failed, for not all descended from Israel are Israel. Ọ bụghị dị ka a ga-asị na okwu Chineke na-ala azụ. Nʼihi na ọ bụghị onye ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị Izrel bụ onye Izrel.
7 Not all Abraham's offspring are his children; rather, "Your offspring will be named through Isaac." Na ha sitere nʼagbụrụ Ebraham pụta emeghị ka ha bụrụ ụmụ Ebraham nʼezie. Ma nʼakụkụ nke ọzọ, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.”
8 That is, the children of the flesh are not children of our Father, but children of the promise count as offspring. Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ.
9 For the promise says: "At this time next year I will come, and Sarah will have a son." Lee ka e si kwee nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”
10 Not only that, but Rebekah too conceived by one man, our father Isaac, Ọ bụghị naanị nke a. Ụmụ Ribeka si nʼotu nna, ya bụ nna nna anyị Aịzik.
11 though not yet born, having done nothing good or bad—so our Father's purpose by election might stand, Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro,
12 not from works, but from him who calls, she was told: "the older will serve the younger." ọ bụghị site nʼọrụ kama ọ bụ site nʼonye ahụ nke na-akpọ, nʼihi na a gwara ya sị, “Nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”
13 As it is written, "Jacob I loved, but Esau I hated." Dịka e dere ya, “Jekọb ka m hụrụ nʼanya ma Ịsọ ka m kpọrọ asị.”
14 What should we say then? Is there injustice with our Father? By no means! Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ bụ onye ajọ omume? Mba!
15 For he tells Moses, "I will have mercy on whom I have mercy, and I will have compassion on whom I have compassion." Nʼihi na ọ gwara Mosis, “Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”
16 So then it depends not on human will or exertion, but on our Father, who has mercy. Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke.
17 For the Scripture says to Pharaoh: "I raised you up for this very reason, to show my power in you, and to have my name proclaimed in all the earth." Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.”
18 So then he has mercy on whomever he wills, and he hardens whomever he wills. Ọ pụtara ihe na ọ bụ naanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị obi ha kpọchiri akpọchi.
19 So you'll ask me, "Why does he still find fault? Who resists his will?" Ma eleghị anya unu pụrụ ịgwa m, “Gịnị kwanụ mere o ji ata anyị ụta? Onye kwanụ pụrụ iguzogide ihe o zubere ime?”
20 But who are you, mere human, to argue with our Father? Does the molded say to its molder, "Why did you make me like this?" Onye ka ị bụ gị mmadụ efu, iji ajụ Chineke ajụjụ? “Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ, ‘Onye sị gị kpaa m otu a?’ ”
21 Does the potter not have authority over the clay, making from one lump a vessel for honor, another for dishonor? Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ?
22 What if our Father, wanting to show his wrath and make known his power, patiently endured vessels of wrath prepared for destruction, Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi?
23 to reveal his glory's riches for vessels of mercy he prepared beforehand for glory, Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a.
24 even us whom he has called, not from the Jews only but also from the Gentiles? Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?
25 As he says in Hosea, "I will call those not my children, my children, and her not beloved, beloved." Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya, “Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m. Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”
26 "And in the very place where it was said to them, 'You are not my people,' there they will be called 'children of the living Father.'" Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ”
27 Isaiah cries out about Israel: "Though Israel's children number like sand of the sea, only a remnant will be saved, Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel, “Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri, maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.
28 for our Father will carry out his sentence upon the earth, fully and without delay." Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”
29 And as Isaiah predicted: "Had the Father of heaven's armies not left us offspring, we'd have become like Sodom, made like Gomorrah." Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”
30 What then should we say? Gentiles not pursuing righteousness attained righteousness, righteousness by faith; Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe,
31 but that Israel, who pursued a law of righteousness, did not reach that law. ma ndị Izrel na-agbaso iwu nke ezi omume, enwebeghị ike ime onwe ha ndị a ga-anabata.
32 Why? Because they pursued it not through faith but as though through works. They stumbled on the stumbling stone, Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nʼihi na ha agbasoghị ya site nʼokwukwe. Kama ha chere na ọ bụ site nʼọrụ. Ha zọhiere ụkwụ nʼoke nkume ịsọ ngọngọ ahụ.
33 as it is written, "See, I am placing in Zion a stumbling stone, a rock that offends; whoever trusts him won't be put to shame." Dịka e dere ya, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]