Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now the Feast of Bread Without Yeast, called Passover, was approaching. Nʼoge a, Mmemme Achịcha na-ekoghị eko nke a na-akpọ Ngabiga na-eru nso.
2 The chief priests and the scribes were looking for a way to kill him, because they feared the people. Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya, nʼihi na ha na-atụ egwu ndị mmadụ.
3 Then Satan entered into Judas, the one called Iscariot, who was one of the twelve. Mgbe ahụ, ekwensu banyere nʼime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya.
4 He went and conferred with the chief priests and temple officers how he might betray him to them. Ọ gakwuru ndịisi nchụaja, na ndịisi ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ya na ha akparịta ụka otu ọ ga-esi rara ya nyefee ya nʼaka ha.
5 They were glad and agreed to give him money. Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kwekwa nkwa inye ya ego.
6 He agreed and began looking for an opportunity to betray him to them away from the crowd. O kwenyere, na-achọkwa ohere ga-adị mma ọ ga-eji nyefee ya nʼaka ha mgbe igwe mmadụ na-agaghị anọ.
7 Then the day of Unleavened Bread arrived, when the Passover lamb had to be sacrificed. O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja.
8 Jesus sent Peter and John, saying, "Go prepare the Passover for us to eat." O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.”
9 They said to him, "Where do you want us to prepare it?" Ha sịrị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoo maka ya?”
10 He said, "Once you enter the city, a man carrying a jar of water will meet you. Follow him into the house he enters, Ọ sịrị ha, “Lee, ka unu na-abata nʼobodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu, soronụ ya baa nʼụlọ ọbụla ọ banyere.
11 "and tell the owner of the house, 'The Teacher says to you: Where is the guest room where I may eat the Passover with my disciples?' Sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri Ngabiga?’
12 And he will show you a large upper room, furnished; prepare it there." Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu dị nʼelu ụlọ nke e dozicharala ihe niile, kwadoonụ nri anyị nʼebe ahụ.”
13 They went and found it just as he had told them, and they prepared the Passover. Ha gara chọpụta ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ha kwadokwara nri Ngabiga ahụ.
14 When the hour came, he reclined at table, and the apostles with him. Mgbe oge awa ahụ ruru, ya na ndị na-eso ụzọ ya gara ebe ahụ nọdụ ala iri ihe.
15 He told them, "I have deeply longed to eat this Passover with you before I suffer. Ọ sịrị ha, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ ka mụ na unu rie nri Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ.
16 For I tell you, I won't eat it until it's fulfilled in the kingdom of our Father." Nʼihi na asị m unu, agaghị m erikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe a ga-emezu ya nʼalaeze Chineke.”
17 Taking a cup and giving thanks, he said, "Take this and divide it among yourselves. O buru iko, mgbe o nyechara ekele ọ sịrị, “Burunu nke a kesaa nʼetiti unu.
18 For I tell you, from now on I will not drink the vine's fruit until our Father's kingdom comes." Nʼihi na asị m unu, site ugbu a ga nʼihu, agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.”
19 He took bread, gave thanks, broke it, and gave it to them, saying, "This is my body, given for you. Do this in memory of me." O werekwara otu ogbe achịcha, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawaa ya nye ha sị, “Nke a bụ ahụ m nke e nyere nʼihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”
20 He did the same with the cup after supper: "This cup is the new covenant in my blood, poured out for you. Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, “Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu.
21 But look—the hand of the one who betrays me is with me on the table. Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri.
22 The Son of Man goes as determined, but woe to that man through whom he is handed over!" Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.”
23 They began asking each other which of them would do this. Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a.
24 A dispute also arose among them about which of them was the greatest. Ịrụ ụka malitere nʼetiti ha banyere onye nʼime ha ka a na-agụ na ọ dị ukwuu karịa ibe ya.
25 He said to them, "Kings of nations dominate them, and rulers over them are called benefactors. Ma ọ sịrị ha, “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Otu aka ahụkwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ.
26 Not so with you: let the greatest among you become like the youngest, the leader like the one serving. Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi.
27 Who is greater—the guest at the table or the one serving? The guest, isn't it? Yet I am among you as one who serves. Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu.
28 "You are those who have stayed with me in my trials, Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.
29 and I confer on you a kingdom, just as my Father conferred one on me, Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya.
30 so you'll eat and drink at my table in my kingdom, and sit on thrones judging the twelve tribes of Israel." Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
31 "Simon, Simon, listen—Satan has demanded to sift all of you like wheat, “Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti.
32 but I prayed for you, that your faith not fail. Once you have turned back, strengthen your brothers." Ma ekpeelara m gị ekpere ka okwukwe gị ghara ịda. Mgbe ị kwudosiri ike, gbaakwa ụmụnna gị ume.”
33 Peter said, "Lord, I'm ready to go with you to prison and death." Ma ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ejikeere m isoro gị gaa mkpọrọ, ma sorokwa gị nwụọ.”
34 Jesus said, "I tell you, Peter: the rooster won't crow today before you deny three times that you know me." Jisọs zara, “Agwa m gị Pita, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ, si na ị maghị onye m bụ.”
35 He asked, "When I sent you without money bag, knapsack, or sandals, did you lack anything?" "Nothing," they said. Ọ gwara ha, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego, maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu?” Ha sịrị, “O nweghị ihe kọrọ anyị.”
36 He said to them, "But now, let the one with a money bag take it, and a knapsack too. Let the one without a sword sell his cloak and buy one. Ọ sịrị ha, “Ugbu a, ọ bụrụ na i nwere akpa ego, were ya, ma werekwa akpa ije. Ọ bụrụkwa na i nweghị mma agha ree uwe mgbokwasị gị zụtara onwe gị otu.
37 For I tell you this Scripture must be fulfilled in me: 'He was counted among sinners.' For what is written about me is coming true." Nʼihi na agwa m unu, na a ga-emejupụta ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ nʼime m, A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Nʼezie, ihe e dere banyere m eruwela mgbe ọ ga-emezu.”
38 They said, "Lord, look, here are two swords." He said to them, "It is enough." Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee mma agha abụọ dị ebe a.” Ọ sịrị ha, “Nke ahụ ezuola.”
39 And he went out, as usual, to the Mount of Olives, and the disciples followed him. Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa.
40 When he reached the place, he told them, "Pray you don't give in to temptation." Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ sịrị ha, “Kpeenụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
41 And he withdrew from them about a stone's throw, and knelt down and prayed, Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị,
42 saying, "Father, if you are willing, take this cup from me. Yet not my will, but yours, be done." “Nna ọ bụrụ na ị chọrọ, nara m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mezuo uche gị.”
43 And an angel from heaven appeared to him, strengthening him. Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume.
44 In agony he prayed more intensely; his sweat became like great drops of blood falling down to the ground. Site nʼoke ihe mgbu, o kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nʼahụ na-adapụ nʼala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.
45 When he rose from prayer, he came to the disciples and found them asleep from grief, Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi.
46 he said to them, "Why are you sleeping? Get up and pray, so you don't yield to temptation." Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
47 While he was still speaking, a crowd came, led by the one called Judas, one of the twelve. He came up to Jesus to kiss him, Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe mmadụ bịara, onye du ha bụ onye a na-akpọ Judas, bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya. Ọ bịaruru Jisọs nso, isutu ya ọnụ.
48 but Jesus said to him, "Judas, would you betray the Son of Man with a kiss?" Ma Jisọs sịrị ya, “Judas, ọ bụ site nʼisutu ọnụ ka i ji arara Nwa nke Mmadụ nye?”
49 Seeing what was about to happen, those with him said, "Lord, should we strike with the sword?" Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe gaje ime, ha sịrị, “Onyenwe anyị, ọ bụ anyị were mma agha gbuo?”
50 And one of them struck the servant of the high priest and cut off his right ear. Otu nʼime ha ji mma gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya.
51 But Jesus answered, "No more of this!" And he touched the ear and healed him. Ma Jisọs sịrị, “O zuola!” O metụkwara ntị nwoke ahụ aka gwọọ ya.
52 Then Jesus said to the chief priests, temple officers, and elders who had come out against him, "Have you come out with swords and clubs, as against a robber? Mgbe ahụ, Jisọs sịrị ndịisi nchụaja, na ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu na ndị okenye, “Gịnị mere unu ji chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m, dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi o ji egbe ezu?
53 Every day I was with you in the temple, and you didn't lay hands on me. But this is your hour, and the authority of darkness." Mgbe mụ na unu na-anọ kwa ụbọchị nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma ugbu a bụ oge awa unu bụrụkwa mgbe ike ọchịchịrị na-achị achị.”
54 Seizing him, they led him and brought him into the high priest's house; Peter followed at a distance. Mgbe ahụ ha jidere ya duru ya pụọ, gaa nʼụlọ onyeisi nchụaja. Pita sokwara ha nʼazụ kama ọ nọ nʼebe dị anya.
55 They lit a fire in the middle of the courtyard and sat together; Peter sat among them. Mgbe ha kwanyere ọkụ nʼetiti mbara ezi obi ahụ, ma nọdụ ala gba ọkụ ahụ gburugburu, Pita sokwara ha nọdụ ala.
56 But a servant girl, seeing him sitting facing the light, stared at him and said, "This one too was with him." Ka ọ na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, “Onye a na Jisọs nọkọrọ.”
57 But he denied it, saying, "Woman, I do not know him." Ma ọ gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.”
58 Shortly after, another saw him and said, "You too are one of them." But Peter said, "Man, I'm not." Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ hụkwara ya kwukwaa sị, “Gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha.” Ma Pita kwuru sị, “Nwoke m, abụghị m.”
59 About an hour later, another insisted, "This man was certainly with him, for he's a Galilean too." Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike, “Nʼezie, nwoke a so ya nʼihi na ọ bụ onye Galili.”
60 But Peter said, "Man, I don't know what you're saying." Immediately, while he was still speaking, the rooster crowed. Pita sịrị, “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu maka ya?” Dị ka ọ kpụ okwu ahụ nʼọnụ, oke ọkpa kwara akwa.
61 The Lord turned and looked at Peter. Peter remembered what the Lord had told him: "Before the rooster crows today, you will deny me three times." Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, “Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
62 And he went out and wept bitterly. Ma ọ pụrụ nʼezi gaa bee akwa na mwute.
63 Now the men who were holding Jesus mocked him as they beat him. Ndị ahụ na-eche ya nche bidoro na-akwa ya emo na-etikwa ya ihe.
64 They blindfolded him and kept asking, "Prophesy! Who is it that struck you?" Ha jiri akwa kechie ya anya, sị ya, “Buo amụma, onye tiri gị ihe?”
65 And they said many other things against him, insulting him. Ha kwukwara ọtụtụ okwu ọjọọ na nke mkparị megide ya.
66 At daybreak, the people's council of elders convened—chief priests and scribes—and led him away to their council, saying, Mgbe chi bọrọ, nzukọ ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu zukọtara, a kpọtakwara Jisọs nʼihu ha.
67 "If you are the Christ, tell us." He said to them, "If I tell you, you will not believe, Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwe.
68 "and if I ask you, you will not answer. Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m.
69 "But from now on the Son of Man will sit at the right hand of the power of our Father." Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.”
70 They all said, "So you are the Son of God?" He said to them, "You say that I am." Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?” Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.”
71 They said, "What more testimony do we need? For we heard it ourselves from his mouth." Mgbe ahụ ha sịrị, “Gịnị mere anyị ji na-achọ onye akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ ya site nʼọnụ ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]