Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Luke 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 He told his disciples, "Offenses are sure to come, but woe to the one they come through! Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa.
2 Better for him to have a millstone hung around his neck and be thrown into the sea than to cause one of these little ones to stumble. Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ.
3 "Watch yourselves. If your brother sins, rebuke him, and if he repents, forgive him. Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya.
4 If he sins against you seven times a day, and seven times returns saying, 'I repent,' forgive him." Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”
5 The apostles said to the Lord, "Increase our faith!" Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!”
6 The Lord said, "If you had faith like a mustard seed, you could tell this mulberry tree, 'Be uprooted and planted in the sea,' and it would obey you. Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.
7 Which of you with a servant plowing or tending sheep tells him, coming in from the field, 'Come at once, recline at the table'? “Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’?
8 Won't he instead say, 'Get my supper ready, dress to serve me while I eat and drink, then you may eat and drink'? Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’?
9 "Does he thank the servant because he did what he was commanded? Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ?
10 So you too, having done all you were commanded, say: 'We are unworthy servants; we've only done our duty.'" Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’ ”
11 On the way to Jerusalem he was passing along between Samaria and Galilee. Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili.
12 As he entered a village, ten men who had leprosy met him. They stood at a distance, Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya.
13 and called out loudly, "Jesus, Master, have mercy on us!" Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.”
14 Seeing them, he said, "Go, show yourselves to the priests." As they went, they were made clean. Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.
15 One of them, seeing he was healed, turned back, praising our Father loudly, Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke.
16 and he fell on his face at Jesus' feet, giving him thanks. Now he was a Samaritan. Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
17 Jesus said, "Weren't ten made clean? Where are the nine? Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ?
18 Was no one found to return and give glory to our Father except this foreigner?" Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?”
19 And he said to him, "Rise and go; your faith has made you well." Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”
20 Asked by the Pharisees when the kingdom of our Father would come, he answered them, "The kingdom of our Father does not come with observation, Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya.
21 nor will they say, 'Look, here!' or 'There!' For the kingdom of our Father is among you." Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu. ”
22 He told the disciples, "Days are coming when you will long to see one of the days of the Son of Man, and you won't see it. Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya.
23 They will say to you, 'Look, there!' or 'Look, here!' Don't go, don't chase after them. Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha.
24 For as lightning flashes and lights the sky from one edge to the other, so the Son of Man will be in his day. Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ.
25 But first he must suffer many things and be rejected by this generation. Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.
26 As Noah's days were, so will the Son of Man's days be. “Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ.
27 They ate, drank, married, and were given in marriage, until the day Noah entered the ark, and the flood came and destroyed them all. Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi.
28 It was the same in Lot's days: eating, drinking, buying, selling, planting, building, “Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ.
29 but the day Lot left Sodom, fire and sulfur rained from heaven and destroyed them all, Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi.
30 so will it be on the day when the Son of Man is revealed. “Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè.
31 On that day, whoever is on the roof with goods inside must not go down for them; likewise, whoever is in the field must not turn back. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita.
32 Remember Lot's wife. Chetakwanụ nwunye Lọt.
33 Whoever seeks to preserve his life will lose it, but whoever loses his life will keep it. Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya.
34 I tell you, that night two will be in one bed: one will be taken, and the other left. Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ.
35 There will be two women grinding together; one will be taken and the other left." Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.”
36 Not in this edition Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ.
37 They asked, "Where, Lord?" He said, "Wherever a corpse lies, the vultures will gather there." Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]