Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 28 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then Isaac called Jacob, blessed him, and commanded him: "Take no wife from Canaan's daughters. Aịzik kpọrọ Jekọb gọzie ya, nye ya iwu sị ya, “Alụla nwunye site nʼala Kenan.
2 Go to Paddan-aram, to Bethuel's house, your mother's father, and take a wife there from Laban's daughters, your mother's brother. Kama bilie gaa Padan Aram nʼụlọ nna nne gị, Betuel, lụrụ nwunye site nʼụmụ ndị inyom Leban.
3 May El Shaddai—your Father Almighty—bless you, make you fruitful, multiply you, so you become a company of peoples. Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gọzie gị, mee ka ị mịa mkpụrụ, mụbaa, ghọọ ọtụtụ mba.
4 May he give you and your offspring with you the blessing of Abraham, that you may inherit the land where you live as a foreigner, which our Father gave to Abraham." Ka Chineke nye gị na ụmụ ụmụ gị ngọzị ahụ o kwere nkwa inye Ebraham. Ka i nweta ala a, nke i bi nʼime ya ugbu a dịka ọbịa, bụ ala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa inye ya.”
5 Isaac sent Jacob away; he went to Paddan-aram, to Laban son of Bethuel the Aramean, brother of Rebekah, mother of Jacob and Esau. Mgbe ahụ Aịzik zipụrụ Jekọb nʼije ya, ọ gara Padan Aram, nʼụlọ Leban nwa Betuel onye Aram, nwanne Ribeka onye bụ nne Jekọb na Ịsọ.
6 Esau discovered that Isaac had blessed Jacob and sent him to Paddan-aram to take a wife from there, charging him as he blessed him, "Do not take a wife from Canaanite women," Ịsọ hụrụ ka Aịzik siri gọzie Jekọb, ziga ya Padan Aram ka ọ gaa lụọ nwunye nʼebe ahụ, nyekwa ya iwu mgbe ọ na-agọzi ya sị, “Alụla nwanyị na Kenan,”
7 and that Jacob had obeyed his father and his mother and had gone to Paddan-aram. Jekọb rubekwara nna ya na nne ya isi gawa Padan Aram.
8 So Esau saw that the daughters of Canaan were displeasing to his father Isaac. O dokwara Ịsọ anya na ndị inyom Kenan dị njọ nʼanya nna ya Aịzik.
9 So Esau went to Ishmael and took Mahalath, daughter of Ishmael son of Abraham and sister of Nebaioth, as a wife besides his other wives. Nʼihi ya, Ịsọ gakwuru Ishmel lụrụ Mahalat, ada Ishmel, nwa Ebraham, onye bụ nwanyị Nebaiot, tinyekwara ndị nwunye ọ lụrụ na mbụ.
10 Jacob left Beersheba and set out toward Haran. Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran.
11 He reached a place and stayed the night, for the sun set. He took one of the stones of the place, put it under his head, and lay down in that place to sleep. Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra.
12 He dreamed: there was a stairway set up on the earth, its top reaching heaven, and there were angels of our Father ascending and descending on it. Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa.
13 And there above it stood our Father, who said, "I am your Father, the God of Abraham your father and of Isaac. I'll give you and your offspring the land you're lying on. Nʼelu ya, ọ hụrụ Onyenwe anyị ka o guzo, nụkwa ka ọ na-agwa ya okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Chineke nna gị Ebraham, na Chineke Aịzik. Aga m enye gị na ụmụ ụmụ gị ala ahụ nke i dina nʼelu ya.
14 Your offspring will be like the dust of the earth; you will spread west, east, north, and south. In you and in your offspring, all the families of the earth will be blessed. Ụmụ gị ga-adị ukwuu, dị ka aja dị nʼala. Ha ga-ejupụta ala a, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼugwu ruo na ndịda. A ga-esitekwa na gị na mkpụrụ gị, gọzie mba niile nke ụwa a.
15 Know this: I'm with you. I'll guard you wherever you go and bring you back to this land. I won't leave you until I've done what I promised you." Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.”
16 Jacob awoke from his sleep and said, "Surely our Father is in this place, and I didn't know!" Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.”
17 He was afraid and said, "How awesome is this place! This is none other than the house of our Father, and this is heaven's gate." Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.”
18 Jacob got up early, took the stone he'd put under his head, set it up as a pillar, and poured oil on top of it. Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya.
19 He named that place Bethel, though Luz had been the city's previous name. Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ.
20 Jacob vowed, "If God is with me and guards me on this journey I'm taking, gives me bread to eat and clothing to wear, Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi,
21 and I return safely to my father's house, then our Father will be my Father, m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-abụ Chineke m.
22 and this stone I've set up as a pillar will be the house of our Father, and of all you give me, I will surely bring you a tenth." Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]