Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 19 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The two angels came to Sodom that evening; Lot sat at Sodom's gate. Seeing them, he rose to meet them and bowed, face to the ground. Nʼoge anyasị, ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịarutere Sọdọm. Lọt nọ ala nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ ha, o biliri jekwuru ha, hulata ihu ya nʼala.
2 "Please, my lords," he said, "stop at your servant's house, spend the night, wash your feet; rise early and go your way." "No," they said, "we'll spend the night in the square." Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.” Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.”
3 He pressed them hard, so they turned aside to him, entered his house. He made them a feast, baked bread without yeast, and they ate. Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya.
4 Before they lay down, the men of the city—Sodom's men—young and old, all the people, without exception, surrounded the house. Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ.
5 They called to Lot, "Where are the men who came to you tonight? Bring them out—let us have sex with them." Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.”
6 Lot went out to them at the entrance, shutting the door behind him, Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya,
7 and said, "Please, my brothers, don't do evil. sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a.
8 I have two daughters who've never been with a man. I'll bring them out to you—do to them as you please. But do nothing to these men; they've come under my roof's protection." Leenụ, enwere m ụmụ nke aka m, ụmụ agbọghọ abụọ na-amaghị nwoke. Ka m kpọpụtara unu ha, ka unu mee ha ihe masịrị unu. Ma hapụnụ ndị ikom ndị a, nʼihi na ha bụ ndị batara izere ndụ nʼụlọ m.”
9 They said, "Get back!" Then, "This outsider came to stay, and now he judges us? We'll treat you worse than them." They pressed hard against Lot and moved in to break down the door. Ha zara sị ya, “Pụọra anyị nʼụzọ. Mbịarambịa ka ị bụ! Leenụ mbịarambịa a! Ọ chọrọ ịbụ onye ikpe. Anyị mee gị ihe, ọ ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha nuru Lọt aka nughachi ya azụ, malite itiwa ọnụ ụzọ ụlọ ya.
10 But the men reached out, pulled Lot into the house with them, and shut the door. Ma ndị ikom ahụ nọ nʼụlọ Lọt, setịpụrụ aka ha dọbata ya nʼụlọ, ma mechie ụzọ ahụ.
11 They struck the men at the house door blind, small to great, till they wore themselves out searching for the door. Ha tiri ndị ikom ndị ahụ nọ nʼọnụ ụzọ ihe otiti nke mere ka ha kpụọ ìsì, onye ukwu ha na onye nta ha. Nʼihi ya, ha enweghị ike ịchọta ọnụ ụzọ ụlọ ahụ.
12 The men said to Lot, "Who else do you have here—son-in-law, sons, daughters, anyone in the city who's yours? Bring them out of this place. Ndị ikom abụọ ahụ gwara Lọt sị, “O nwere onye ọbụla ọzọ i nwere nʼebe a? Ndị ọgọ nwoke, maọbụ ụmụ gị ndị ikom, maọbụ ụmụ gị ndị inyom, na ọ bụ onye ọbụla bụ nke gị nʼobodo a. Site nʼebe a kpọpụ ha!
13 We're about to destroy this place - the outcry against its people has grown great before our Father, and our Father sent us to destroy it." Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru Onyenwe anyị ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.”
14 Lot went out and spoke to his sons-in-law, betrothed to his daughters: "Get up, leave this place—our Father is about to destroy the city!" Yet his sons-in-law took it as a joke. Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu.
15 At dawn the angels urged Lot: "Get up, take your wife and two daughters here, or you'll be consumed in the city's punishment." Nʼụtụtụ, mgbe chi na-abọta, ndị mmụọ ozi a kwagidere Lọt sị ya, “Ọsọ, kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a site nʼebe a gbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-ekpochapụ unu nʼihi ajọ omume ndị obodo a.”
16 He hesitated, so the men grabbed his hand, his wife's, and two daughters', our Father pitying him, and they brought him out and left him outside the city. Mgbe Lọt ka nọ na-eche ihe ọ ga-eme, ndị ikom ahụ jidere ya nʼaka, jidekwa nwunye ya, na ụmụ ya ndị inyom abụọ duru ha pụọ nʼobodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼebe ha nọ.
17 When they were brought outside, one of them said, "Run for your life! Don't look back or stop anywhere in the valley. Flee to the hills, or you'll be swept away." Mgbe ha si nʼime obodo kpọpụta ha, otu onye nʼime ha gwara ha sị, “Gbalaganụ nʼihi ndụ unu. Unu elekwala anya nʼazụ. Unu akwụsịkwala ebe ọbụla na mbara ala. Gbaganụ nʼugwu, nʼihi na ọ bụrụ na unu emeghị otu a, a ga-ekpochapụ unu.”
18 But Lot said to them, "No, please, my Sovereign Father. Ma Lọt sịrị ha, “Mba, ndị nwe m, bikonu,
19 Your servant has found favor with you; you've shown great kindness saving my life. But I can't flee to the hills—disaster will catch me and I'll die. ohu unu achọtala amara nʼihu unu, unu egosila m obi ebere dị ukwuu site nʼichebe ndụ m. Ma agaghị m enwe ike gbalaga nʼugwu ka mbibi a ghara ịdakwasị m, m nwụọ.
20 Please—that town is near, small enough to run to. Let me escape there—isn't it small?—so I may live." Lee obodo dị nso nke m nwere ike ịgbaga. Ọ bụ obodo dị nta. Kwere ka m gbaga nʼebe ahụ. Obodo nta ka ọ bụ, ọ bụghị ya? Aga m echebekwa ndụ m na ya.”
21 He said to him, "I grant this favor too: I won't overthrow the town you mentioned. Ọ zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m emere gị dịka arịrịọ gị si dị. Agaghị m emebi obodo nta ahụ.
22 Hurry, flee there—I can do nothing until you arrive." That's why the town is named Zoar. Ma mee ngwangwa, nʼihi na o nweghị ihe ọbụla m ga-eme tutu ruo mgbe i ruru nʼebe ahụ.” (Ọ bụ nke a mere e ji akpọ aha obodo ahụ Zoa.)
23 The sun had risen over the land when Lot reached Zoar. Mgbe Lọt rutere obodo Zoa, anwụ awalitela nʼala ahụ.
24 Then our Father rained sulfur and fire out of heaven on Sodom and Gomorrah. Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke Onyenwe anyị mere ka o si nʼeluigwe zoo.
25 He destroyed those cities, the whole plain, all the cities' residents, and everything growing on the ground. Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala.
26 But Lot's wife looked back from behind him, and she became a pillar of salt. Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu.
27 Early the next morning Abraham went to the place where he had stood before our Father. Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu Onyenwe anyị nʼụbọchị gara aga.
28 He looked toward Sodom, Gomorrah, and the whole plain, and saw smoke rising from the land like smoke from a kiln. Ọ lepụrụ anya nʼebe obodo Sọdọm na Gọmọra dị, na nʼebe mbara ala ndị ahụ niile dị. Ọ hụrụ anwụrụ ọkụ dị ukwuu nke si nʼala ahụ na-alali elu. Anwụrụ ọkụ a dị ka anwụrụ ọkụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-enwusi ike.
29 When our Father destroyed the plain's cities, our Father remembered Abraham and brought Lot out of the overthrow of the cities where Lot lived. Ya mere, mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị na mbara ala, o chetara Ebraham, kpọpụta Lọt site nʼoke mbibi ahụ e bibiri obodo ndị ahụ Lọt bi nʼime ha.
30 Lot went up from Zoar to live in the mountains with his two daughters, afraid to stay in Zoar; he and his two daughters lived in a cave. Emesịa, Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ hapụrụ obodo Zoa, nʼihi na ọ tụrụ egwu ibi nʼime Zoa. Ọ gara biri nʼime ọgba nkume ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ.
31 The firstborn told the younger, "Our father is old; no man remains in the land to sleep with us, as is customary everywhere. Otu ụbọchị, ada ya sịrị nke nta, “Nna anyị emeela agadi, ọ nwekwaghị nwoke ọbụla nọ nʼụwa a, onye ga-enye anyị ụmụ, dịka omenaala si dị nʼụwa niile.
32 Come, let's give our father wine, then sleep with him, and keep offspring alive through our father." Ka anyị mee ka nna anyị ṅụọ mmanya, ka anyị na ya dinakọọ, ka anyị chebe agbụrụ anyị site na nna anyị.”
33 That night they gave their father wine; the firstborn went in and lay with him. He never knew when she lay down or rose. Nʼabalị ahụ, ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya, nke ada banyere soro nna ya dina. Ha abụọ nwere mmekọ. Ma ọ amaghị mgbe ada ya dinara maọbụ mgbe o bilikwara.
34 Next day the firstborn said to the younger, "I slept with my father last night. Let's give him wine again tonight—go sleep with him, so we preserve offspring from our father." Nʼechi ya, ada gwara nwanne ya nke nta, “Mụ na nna anyị dinara nʼabalị gara aga. Ka anyị mee ka ọ ṅụọkwa mmanya nʼabalị taa, ka ị gaakwa ka gị na ya dina. Ka anyị mee ka agbụrụ anyị dịgide site na nna anyị.”
35 That night too they had their father drink wine; the younger got up and slept with him, and he did not know when she lay down or when she got up. Ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya nʼabalị ahụ, ada ya nke nta banyere ya na nna ya dinaa. Dịka ọ dịkwa na mbụ, nna ha amataghị mgbe o dinara ala maọbụ mgbe o bilitere.
36 So both of Lot's daughters became pregnant by their father. Ya mere, ụmụ ndị inyom Lọt abụọ ndị a tụrụ ime site nʼaka nna ha.
37 The firstborn bore a son, named him Moab—father of the Moabites to this day. Nke ada mụtara nwa nwoke onye ọ gụrụ Moab. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Moab ruo taa.
38 The younger also had a son and named him Ben-Ammi—father of the Ammonites to this day. Nwa ya nke nta mụtakwara nwa nwoke onye ọ gụrụ Ben-Ammi. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Amọn ruo taa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]