Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Abram went up from Egypt to the Negev, he, his wife, all he had, and Lot with him. Ebram na nwunye, na ihe niile ha nwere hapụrụ ala Ijipt, gaa ije bịaruo Negev. Lọt sokwa ha.
2 Now Abram had become very rich in livestock, in silver, and in gold. Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo.
3 He went by stages from the Negev to Bethel, to the place between Bethel and Ai where his tent stood before, Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ.
4 and where he had first built an altar. There Abram called on the name of our Father. Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha Onyenwe anyị.
5 Now Lot, who was traveling with Abram, also had flocks and herds and tents. Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu.
6 The land could not support them living together; their possessions were too great to stay together. Ma ala ebe ha nọ ezurughị ha mgbe ha nọkọrọ ọnụ nʼihi na ihe onwunwe ha dị ukwuu ruo na ha enweghị ike ịnọkọ ọnụ.
7 A quarrel arose between Abram's herders and Lot's herders. The Canaanites and Perizzites were living in the land at that time. Nke a mere esemokwu ji dapụta nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt. Ndị Kenan na ndị Periz bikwa nʼala ahụ nʼoge ahụ.
8 Abram said to Lot, "Let's not quarrel—you and me, or your herders and mine—we're brothers. Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne.
9 Isn't the whole land before you? Please, separate from me: if left, I'll go right; if right, I'll go left." Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.”
10 Lot looked up and saw that the whole Jordan plain toward Zoar was well watered everywhere—like our Father's garden, like Egypt's land. (This was before our Father destroyed Sodom and Gomorrah.). Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige Onyenwe anyị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu Onyenwe anyị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.)
11 Lot chose the whole Jordan plain for himself and traveled eastward; the two parted from each other. Ya mere, Lọt họọrọ nye onwe ya mbara ala Jọdan niile, chee ihu ịga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ya na Ebram kewara.
12 Abram lived in the land of Canaan; Lot lived among the cities of the plain and pitched tents as far as Sodom. Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm.
13 Now the people of Sodom were wicked, sinning greatly against our Father. Ma ndị Sọdọm bụ ndị obi tara mmiri, ndị na-emehie nke ukwuu megide Onyenwe anyị.
14 After Lot parted from him, our Father told Abram, "Look up from where you stand: north, south, east, and west. Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
15 For all the land that you see I will give to you and to your children forever. Ala ahụ niile ị hụrụ ka m ga-enye gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi.
16 I will make your children like the dust of the earth—if the dust of the earth can be counted, so can your children. Aga m eme ka mkpụrụ gị baa ụba dịka aja dị nʼala. Ọ bụrụ na mmadụ enwe ike ịgụta ọnụọgụgụ aja dị nʼala, ha ga-enwe ike gụta ọnụọgụgụ mkpụrụ gị.
17 Get up, walk the land's length and breadth, for I am giving it to you." Bilie jegharịa nʼala ahụ niile nʼakụkụ ya ọbụla, nʼihi na ana m enye gị ha niile.”
18 Abram pitched his tents, went and settled by the oaks of Mamre at Hebron, and built an altar there to our Father. Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]