Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Exodus 39 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 From the blue, purple, and scarlet yarn they made finely woven garments for serving in the holy place; they made the holy garments for Aaron, as our Father commanded Moses. Ha sitekwara nʼogho akwa na-acha anụnụ anụnụ na nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie (odo odo), nke na-acha uhie uhie, meere ndị nchụaja uwe akpara akpa nke ọma iyi jee ozi nʼebe nsọ ahụ. Ha meekwara Erọn uwe nsọ, nʼusoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
2 He made the ephod of gold, of blue, purple, and scarlet yarn, and of finely woven linen. Ha ji ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, na nke na-acha uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ.
3 They hammered gold into sheets, cut it into threads, and worked them into the blue, purple, and scarlet yarn and fine linen—the work of a skilled designer. Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
4 They made shoulder pieces for it, joined together at its two edges. Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike.
5 The ephod's woven band was one piece with it, made the same way: gold, blue, purple, and scarlet yarn, and finely twisted linen, as our Father commanded Moses. Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
6 They made the onyx stones, mounted in gold filigree settings, engraved like seal engravings, with the names of Israel's sons. Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara.
7 He put them on the ephod's shoulder pieces as memorial stones for Israel's sons, as our Father had commanded Moses. Ha jikọtara ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ, ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
8 He made the breastpiece—skilled work like the ephod's—of gold, blue, purple, scarlet yarn, and finely twisted linen. Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya.
9 Square and doubled, they made the breastpiece—about nine inches long and nine inches wide, doubled. Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ.
10 They set in it four rows of stones. The first row was carnelian, topaz, and emerald; Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril,
11 the second row, turquoise, sapphire, and emerald; nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
12 the third row, jacinth, agate, and amethyst; Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti.
13 the fourth row, beryl, onyx, and jasper. They were enclosed in gold filigree settings. Nʼahịrị nke anọ bụ: nkume topaazi, ọniks na jaspa. Ahịọnyere ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
14 Twelve stones, one per name of Israel's sons, each engraved like a seal with its own name, for the twelve tribes. Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
15 For the breastpiece they made braided chains of pure gold, like cords. Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
16 They made two gold filigree settings and two gold rings, fastening the two rings to the breastpiece's two ends. Ha mere ihe ọlaedo abụọ nke a kpara akpa, ya na mgbaaka ọlaedo abụọ. Dụnyekwa mgbaaka ndị ahụ na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
17 They fastened the two gold cords to the two rings at the ends of the breastpiece. Ha dụnyere ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ.
18 They put the two ends of the two cords on the two filigree settings, and put them on the ephod's shoulder pieces, at its front. Were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa. Konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.
19 They made two gold rings and put them on the breastpiece's two ends, on its inner edge facing the ephod. Ha mere mgbaaka ọlaedo. Konyekwa ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.
20 They made two gold rings and put them on the two shoulder pieces of the ephod, low on the front, near the seam above its woven band. Mgbe ahụ, ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konyekwa ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe ihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.
21 They fastened the breastpiece's rings to the ephod's rings with a blue cord, so it would rest on the ephod's woven band and not come loose from the ephod, as our Father commanded Moses. Ha jikwa eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọta ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ hapụ ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
22 Bezalel made the robe of the ephod entirely of blue, the work of a weaver. Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa.
23 Its opening was in the center, like a collar's opening, with a woven binding around it so it wouldn't tear. A ga-enwe oghere nʼetiti uwe mwụda ahụ, dịka oghere olu uwe agha, nwekwa akwa nta a dụnyere nʼokpuru oghere a, ime ka o sie ike gharakwa ịdọka.
24 They made pomegranates of blue, purple, and scarlet yarn and twisted linen on the robe's hem. Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ.
25 They made pure gold bells and set them between the pomegranates on the robe's hem, all around between the pomegranates. Ha dụnyekwara ataṅụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, gburugburu nʼọnụ ọnụ ala ya nʼetiti pomegranet ndị ahụ.
26 Bell and pomegranate, bell and pomegranate, around the robe's hem for serving, as our Father commanded Moses. Otu ataṅụ, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, otu a ka a dụnyere ya gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, nke a ga-eyi mgbe a na-eje ozi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
27 For Aaron and his sons they made the tunics of fine linen, the work of a weaver, Ha ji ezi akwa ọcha metara Erọn na ụmụ ya ndị ikom, uwe ime ahụ, akaọrụ nke onye ọkpa akwa,
28 the fine-linen turban, the beautiful fine-linen caps, and linen undergarments of finely twisted linen. jirikwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi, okpu akwa ọcha, na uwe ukwu nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.
29 The sash: finely woven linen, blue, purple, and scarlet yarn, embroidered work, as our Father commanded Moses. Ihe ike nʼukwu bụ nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie uhie, na uhie uhie, nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma, dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
30 They made the holy crown's plate from pure gold, engraved like a seal: "Holy to our Father." Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
31 They tied a blue cord to it, fastening it on the turban above, as our Father commanded Moses. Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
32 All the work of the tabernacle, the tent of meeting, was finished. Israelites did everything our Father commanded Moses—so they did. Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.
33 They brought Moses the tabernacle: the tent, all its furnishings, clasps, frames, crossbars, posts, and bases; Mgbe ahụ, ha buteere Mosis ụlọ nzute ahụ: ụlọ ikwu ahụ ya na ngwongwo ya niile, ya bụ nko ya niile, mbudo ibo ya niile, mkpọrọ osisi ya niile, ogidi ya niile na ụkwụ ya niile,
34 the covering of red-dyed ram skins, the covering of fine leather, and the screening curtain, na akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri e ji emechi elu ụlọ nzute ahụ, na akwa mgbochi,
35 the ark of the testimony with its poles and the mercy seat; na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, ya na mkpara e ji ebu ya, na oche ebere ya,
36 the table with all its utensils and the bread of the Presence; na tebul ahụ, ya na ngwongwo ya niile na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
37 the pure gold lampstand, its arranged lamps, all its utensils, and oil for the light; na ihe ịdọkwasị oriọna e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, na iheọkụ ya niile na ngwongwo ya niile, na mmanụ oliv maka ịmụ ọkụ,
38 the gold altar, anointing oil, fragrant incense, and the tent entrance screen; na ebe ịchụ aja ọlaedo, mmanụ nsọ na ụda na-esi isi ụtọ na akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ ụlọ nzute,
39 the bronze altar with its bronze grate, poles, and all its utensils, the basin and its stand; na ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara ya niile na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ ya na ihe ndọkwasị ya,
40 the courtyard's curtains, posts, and bases, the courtyard entrance screen, ropes, pegs, and all the equipment for the tabernacle's service, the tent of meeting; akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ, na ogidi ya na ihe ndọkwasị ya nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ; ụdọ na ǹtu ịkpọgide ogige ahụ; ngwongwo niile nke ụlọ nzute ahụ, ụlọ ikwu nzute ahụ
41 and the finely woven garments for serving in the holy place, the holy garments for Aaron the priest, and his sons' garments for priestly service. na uwe niile a kpara akpa, nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja, na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.
42 The people of Israel had done all the work just as our Father had commanded Moses. Ndị Izrel niile rụzuru ọrụ ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.
43 Moses inspected all the work: they had done it as our Father commanded—so they had done it. Moses blessed them. Mosis nʼonwe ya hụkwara ọrụ ndị a niile, nabata ya ka nke e jere dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị. Nʼihi ya, Mosis gọziri ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]