Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Peter 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Beloved, this is now the second letter I write you; in both I stir up your sincere mind by reminder. Ndị enyi m, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu. Nʼime ha abụọ, ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ niile unu maara na itute uche unu banyere echiche zuruoke.
2 Remember the words the holy prophets spoke beforehand, and the command of our Lord and Savior given through your apostles. Achọrọ m ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru mgbe ochie na iwu nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị nyere site na ndị ozi ya.
3 Know this first: mockers will come in the last days, mocking, following their own lusts. Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ
4 They will ask, "Where is his promised coming? Since the fathers fell asleep, everything continues as it has since creation's beginning." na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.”
5 They willfully ignore this: long ago, by our Father's word, heavens existed, and earth formed out of water and through water, Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu.
6 and through these the world of that time was deluged with water and perished. Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ.
7 By the same word, today's heavens and earth are stored up for fire, kept for the day of judgment and destruction of the wicked. Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.
8 Don't overlook this, loved ones: with our Father, one day is like 1,000 years, and 1,000 years like one day. Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị.
9 Our Father isn't slow to keep his promise, as some think; he's patient with you, wanting no one to perish, but all to reach repentance. Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.
10 But the day of our Lord Jesus will come like a thief: the heavens will vanish with a rushing sound, the elements will burn and melt, and the earth with all its works will be exposed. Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.
11 Since all this will dissolve, what sort of people should you be? You should live holy lives, devoted to God, Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke,
12 as you wait for and hasten the coming of our Father's day, when the heavens will be set ablaze and dissolved, and the elements melt in the heat. dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.
13 But as he promised, we wait for new heavens and a new earth, where righteousness lives. Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.
14 So, beloved, awaiting these things, strive to be found by him in peace, spotless and without defect. Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo.
15 Regard our Lord's patience as salvation, just as our beloved brother Paul wrote you, with the wisdom given him, Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya.
16 as in all his letters, where he speaks about these things. Some parts are hard to understand, and the ignorant and unstable twist them—as they do the other Scriptures—to their own destruction. O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi.
17 So then, loved ones, knowing this in advance, guard yourselves, so you aren't swept away by the error of lawless people and lose your own firm standing. Ya mere, ezi ndị enyi m, ebe unu matara nke a, nọrọnụ na nche ka a ghara isite na njehie ndị na-emebi iwu duhie unu, ime ka unu si nʼọnọdụ unu daa.
18 Grow in the grace and knowledge of our Lord and Savior Jesus Christ. To him be glory, now and to the day of eternity. Amen. Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]