Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 John 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Everyone who believes Jesus is the Christ has been born of our Father, and everyone who loves the Father who gives birth loves the child born of him. Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya.
2 By this we know we love the children of our Father: when we love our Father and keep his commands. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.
3 This is love of our Father: that we keep his commands, and his commands aren't burdensome. Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.
4 Everyone born of our Father overcomes the world. This is the victory that overcame the world: our faith. Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị.
5 Who overcomes the world except the one believing Jesus is the Son of our Father? Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
6 Jesus Christ came by water and blood—not water only, but water and blood. The Holy Spirit testifies to this, because the Holy Spirit is the truth. Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu.
7 For there are three that testify: Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe:
8 the Spirit, the water, and the blood; and these three are in agreement. Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara.
9 If we accept human testimony, our Father's testimony is greater—for this is our Father's testimony: that he testified about his Son. Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
10 Whoever believes in the Son of our Father carries this testimony within himself. Whoever does not believe has made him a liar, since he hasn't believed the testimony our Father gave about his Son. Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
11 And this is the testimony: our Father gave us eternal life, and this life is in his Son. Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya.
12 Whoever has the Son has life; whoever lacks the Son of our Father lacks life. Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
13 I write these things to you who believe in the name of the Son of our Father, so you may know you have eternal life. Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi.
14 This is our confidence before him: whatever we ask according to his will, he hears us. Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị.
15 And if we know he hears us—whatever we ask—we know we have what we asked him for. Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.
16 If anyone sees his brother sin a sin not leading to death, he should ask, and our Father will give him life—to those sinning not to death. There's a sin leading to death; I'm not saying he should pray about that. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.
17 All wrongdoing is sin, and there is sin that does not lead to death. Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.
18 We know: whoever is born of our Father does not keep sinning, but the One who was born of our Father protects him, and the evil one cannot touch him. Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka.
19 We know we are from our Father, and the whole world lies under the evil one's power. Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ.
20 We know the Son of our Father has come and given us understanding, to know the One who is true. We are in the One who is true, in his Son Jesus Christ. He is the true God and eternal life. Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi.
21 Little children, keep yourselves from idols. Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]