Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Chronicles 28 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 David assembled at Jerusalem all Israel's officials: officials of the tribes, commanders of the divisions serving the king, commanders of thousands and hundreds, stewards over all the king's and his sons' property and livestock, with the court officials, the mighty men, and all valiant warriors. Devid kpọkọtara ndịisi ozi niile nke Izrel, ka ha zukọọ na Jerusalem, bụ ndị ndu ebo Izrel niile, na ndị ọchịagha nke otu ndị agha nọ nʼọrụ eze. Ndị ọzọ bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ihe niile na anụ ụlọ niile nke eze na ụmụ ya ndị ikom nwere, tinyere ndị ozi niile nọ nʼụlọeze, na ndị bụ dimkpa na ndị niile bụ dike nʼagha.
2 King David rose to his feet and said, "Listen to me, my brothers and my people. I had it in my heart to build a house of rest for the ark of our Father's covenant, the footstool for his feet, and I prepared to build it. Eze Devid biliri kwụrụ ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ụmụnna m, na ndị m. Ọ bụrịị ihe dị m nʼobi iwu ụlọ nke ga-abụ ebe izuike nye igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, nke ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ nye Chineke anyị. Edokọtachaala m ihe e ji ewu ya,
3 But our Father told me, 'You won't build a house for my name, because you're a man of war who has shed blood.' ma Chineke sịrị m, ‘Ọ bụghị gị ga-ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị bụ onye na-ebu agha, onye wufuru ọbara site nʼigbu ọtụtụ mmadụ nʼagha.’
4 Yet our Father of Israel chose me, from my whole father's house, to reign over Israel forever. For our Father chose Judah to lead, and within Judah's house, chose my father's house; and of my father's sons he delighted to make me king over all Israel. “Ma otu ọ dị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel esitela nʼetiti ikwu m họpụta m, mee m eze Izrel ruo ebighị ebi. Ọ họọrọ ebo Juda dịka onyendu. Ọ bụkwa site nʼebo Juda ka o si họrọ ụlọ nna m, sitekwa nʼetiti ụmụnne m ndị ikom họrọ m. Mee m eze Izrel.
5 Of all my sons—our Father has given me many—he chose Solomon my son to sit on the throne of our Father's kingdom over Israel. Onyenwe anyị enyela m ọtụtụ ụmụ ndị ikom, ma site nʼime ha ọ họpụtara Solomọn nwa m ka ọ nọkwasị nʼocheeze nke alaeze Onyenwe anyị dịka eze Izrel.
6 He told me, 'Solomon your son will build my house and my courts, for I chose him as my son, and I will be his father.' Ọ gwara m, ‘Solomọn nwa gị, bụ onye ga-ewuru m ụlọ m, na ogige m niile, nʼihi na ahọpụtala m ya ị bụrụ m nwa, aga m abụkwara ya nna.
7 I will establish his kingdom forever if he stays firm to keep my commands and judgments, as he does today. Ọ bụrụkwa na o debe ihe niile m nyere nʼiwu, mezuo ha dịka o si eme nʼoge a. Aga m eme ka alaeze ya dịgide ruo ebighị ebi.’
8 "So now, before all Israel, the assembly of our Father, and in his hearing, keep and seek out every command of your Father, so you may possess this good land and leave it to your children after you forever. “Ya mere, ugbu a ana m enye unu iwu nʼihu ndị Izrel niile, na nʼihu ọgbakọ ndị nke Onyenwe anyị, na nʼihu Chineke anyị. Kpachapụnụ anya chọpụta ma debekwa iwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu, ka unu nwee ike nweta ezi ala nke a; ma nyefeekwa ya dịka ihe nketa nʼaka ụmụ ụmụ unu ruo ebighị ebi.
9 You, Solomon my son, know the God of your father, and serve him with a whole heart and willing mind—our Father searches every heart, understands every plan and thought. Seek him and you'll find him; abandon him and he'll reject you forever. “Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.
10 Take note, since our Father chose you to build a house for the sanctuary. Be strong, act." Kpachapụ anya, nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla gị iwuru ya ụlọnsọ ya. Dị ike, rụọkwa ọrụ a e tinyere gị nʼaka.”
11 David gave Solomon his son the plan of the portico of the temple, its buildings, its storerooms, its upper rooms, its inner rooms, and the room of the mercy seat, Mgbe ahụ, Devid nyere Solomọn nwa ya ihe e sere gbasara otu ọ ga-esi wuo ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, na nke ụlọ ndị ọzọ niile ga-adị nʼime ya, na nʼakụkụ ya; ụlọakụ ya niile, na ime ụlọ elu ya, na ime ụlọ ya, na ụlọ ebe ikpuchi mmehie.
12 and the plan of all he had in mind for the courts of our Father's house, for all the surrounding rooms, for the storerooms of his house, and for the storerooms of the dedicated gifts; O nyekwara ya ihe osise gosiri ihe niile nke Mmụọ Nsọ tinyere ya nʼuche banyere ogige ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị ahụ, na ọnụụlọ niile dị ya gburugburu, maka ụlọ nchịkọta akụ nke ụlọnsọ Chineke nakwa akụ niile nke e doro nsọ.
13 for the divisions of the priests and Levites, for all the work of service in our Father's house, and all the vessels for service in his house. Devid nyekwara Solomọn iwu otu ọ ga-esi kewaa ndị nchụaja na ndị Livayị, na iwu metụtara ọrụ ije ozi niile nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na iwu metụtara ngwongwo niile e ji eje ozi.
14 He gave gold by weight for each gold article for every kind of service, and silver by weight for each silver article for every kind of service. Ọ wepụtara ọlaedo dị ukwuu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaedo a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtakwara ọlaọcha dị ukwu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaọcha a ga-eji jee ozi dị iche iche.
15 The weight for the gold lampstands and their gold lamps, the weight of gold for each gold lampstand and its lamps, and the weight of silver for each silver lampstand and its lamps, according to each lampstand's use. Ọ wepụtara ọlaedo nke e ji akpụ iheọkụ na ihe ịdọba iheọkụ. Wepụtakwa ọlaọcha ga-ezu ịkpụ oriọna ọlaọcha, na ihe ịdọba ha.
16 Gold's weight for each table of the bread of the Presence; and silver for the silver tables. Ọ wepụtara ọlaedo e ji akpụ tebul achịcha nsọ, na ọlaedo e ji akpụ tebul ndị ọzọ, na ọlaọcha e ji akpụ tebul ọlaọcha.
17 The forks, basins, and pitchers of pure gold; the weight for each gold dish; the weight for each silver dish; Ọ wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ndụdụ e ji adụrụ anụ e ji chụọ aja, efere ịkwọsa mmiri na ite mmiri; ọlaedo zuru nke e ji akpụta efere ọlaedo ọbụla, na ọlaọcha zuru nke e ji akpụta efere ọlaọcha ọbụla, wepụtakwa ọlaọcha na ọlaedo.
18 refined gold by weight for the incense altar; gold for the design of the chariot—the cherubim spreading their wings and covering the ark of the covenant of our Father. Nʼikpeazụ, o wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. O nyere ya ihe osise gosiri otu a ga-esi wuo ụgbọ agha, ya bụ, mmụọ ozi cherubim ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ, ndị gbasapụrụ nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
19 "All this," David said, "I have in writing from our Father's hand, who gave me understanding of all the plan's details." Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka Onyenwe anyị nweta. Onyenwe anyị nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.”
20 David told his son Solomon, "Be strong and courageous; do the work. Don't fear or be discouraged, for my Father is with you. He won't fail or abandon you until all the work for the service of the house of our Father is finished. Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị.
21 Look—the priests and Levites are divided, ready for all the service of our Father's house. Every skilled, willing man will join you in any task, with the officials and all the people, fully at your command." Ndị nchụaja ndị a niile, na ndị Livayị jikeere ịrụ ọrụ niile metụtara ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. Ndị ọzọ bụ ndị ọka ọrụ dị iche iche ndị o metụrụ nʼobi ga-abịakwa inyere gị aka, ma ndị ozi, ma ndị Izrel niile; ha ga-emezu iwu ọbụla i nyere ha.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]