Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Chronicles 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 David said, "This is the house of our Father, and this the altar of burnt offering for Israel." Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru Onyenwe anyị Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.”
2 David ordered the foreigners in Israel gathered, then appointed stonecutters to cut dressed stones for building the house of our Father. Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke.
3 David provided abundant iron for gate-door nails and clamps, and abundant bronze beyond weighing, Devid wetara ọtụtụ igwe dị ukwuu, nke ha ji akpụta ǹtu maka ibo ọnụ ụzọ ama niile, na nke ịkpụ ihe njikọta niile. O wetakwara bronz a na-apụghị ịkọwa ịdị arọ ya.
4 and cedar timbers beyond counting, for the Sidonians and Tyrians brought David cedar logs in abundance. O webatakwara osisi sida nʼapụghị ịgụta ọnụọgụgụ ha, nʼihi na ndị Taịa na Saịdọn butere ha nʼọnụọgụgụ riri nne nye Devid.
5 For David said, "My son Solomon is young and untested, and the house built for our Father must be truly great, famed, and glorious in every land. Let me prepare for it." So David laid in vast provisions before he died. Mgbe ahụ, Devid kwuru, “Solomọn nwa m bụ nwantakịrị, onye na-amachabeghị ihe. Ma ụlọnsọ a ga-ewuru Onyenwe anyị ga-abụ ụlọ dị ukwuu, nke ga-enwe aha a ma ama, na nke mara ezi mma nʼanya mba niile dị nʼụwa. Nʼihi ya, aga m akpakọba ihe niile e ji ewu ya.” Ya mere, tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ngwongwo riri nne.
6 Then he called Solomon his son and charged him to build a house for our Father of Israel. Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel ụlọ.
7 David told Solomon, "My son, I had it in my heart to build a house for my Father's name. Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi iwu ụlọ maka aha Onyenwe anyị bụ Chineke m,
8 The word of our Father came to me: 'You have shed much blood and fought great wars. You will not build a house for my name, because you have shed so much blood on the earth before me.' ma okwu Onyenwe anyị ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m.
9 A son will be born to you, a man of rest; I will give him rest from all his enemies around him. His name will be Solomon; I will give Israel peace and quiet in his days. Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya.
10 He will build a house for my name. He will be my son, and I his father. I will secure his royal throne over Israel forever. Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’
11 Now, my son, may our Father be with you, so that you may succeed and build the house of your Father, as he said about you. “Ya mere, ugbu a nwa m, ka Onyenwe anyị nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme.
12 Only, may our Father give you wisdom and understanding when he puts you in charge of Israel, to keep the law of your Father. Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị.
13 Then you'll prosper, if you carefully keep the statutes and rules our Father commanded Moses for Israel. Be strong and brave. Don't be afraid or discouraged. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba.
14 See, with great effort I've provided for the house of our Father nearly 4,000 tons of gold, about 34,000 tons of silver, and bronze and iron beyond weighing—there's so much. I've also provided timber and stone; you may add to them. “Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha.
15 You have many workers with you: stonecutters, masons, carpenters, and all kinds of craftsmen skilled in every trade. Lee, i nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ ndị na-awa nkume, na ndị na-edo nkume, na ndị ọka osisi, na ndị a maara aha ha nʼihe gbasara ǹka nʼọrụ dị iche iche,
16 Skilled with gold, silver, bronze, and iron beyond count. Rise up and work; may our Father be with you." ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, ndị ọrụ nʼenweghị ọnụọgụgụ. Onyenwe anyị aghaghị ịnọnyere gị. Bilie, rụọ ọrụ dịịrị gị.”
17 David also commanded all the leaders of Israel to help Solomon his son, saying, Devid nyere ndịisi Izrel iwu ka ha nyere nwa ya Solomọn aka, mgbe ọ ga-ewu ụlọ ahụ.
18 "Isn't your Father with you? Hasn't he given you rest on every side? For he has given the land's people into my hand, and the land is subdued before our Father and his people. Ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ na Onyenwe anyị Chineke anọnyereghị unu? Ọ bụ na o nyebeghị unu udo nʼakụkụ niile? Nʼihi na o nyela m mmeri nʼebe ndị iro m nọ. Ugbu a, ala a dịkwa nʼaka Onyenwe anyị na nʼaka ndị ya.
19 Now set your heart and soul to seek your Father. Arise and build the sanctuary of our Father, to bring the ark of his covenant and his holy vessels into the house built for his name." Ya mere, tinyenụ obi unu na mmụọ unu nʼịgbaso Onyenwe anyị Chineke unu. Malitekwanụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke, ka unu nweekwa ike ibubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ihe nsọ ndị ọzọ nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a ga-ewu nʼihi Aha Onyenwe anyị.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]