Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Chronicles 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 After David settled in his house, he told Nathan the prophet, "Look, I live in a cedar house, but the ark of our Father's covenant sits under tent curtains." Mgbe Devid nọsara ahụ nʼụlọeze ya, ọ sịrị Netan onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị nʼokpuru ụlọ ikwu.”
2 Nathan replied to David, "Do all that is in your heart, for our Father is with you." Netan zaghachiri Devid, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi, mee ya, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.”
3 But that night the word of our Father came to Nathan: Ma nʼabalị ahụ, okwu Chineke rutere Netan ntị, na-asị,
4 Go tell David my servant: "This is what your Father says: You are not the one to build me a house to live in." “Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Gị onwe gị agaghị ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi,
5 I haven't lived in a house from the day I brought Israel up to now—I've moved tent to tent, dwelling to dwelling. nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta Izrel ruo taa. Kama e sitela m nʼotu ọmụma ụlọ ikwu baa na nke ọzọ, sitekwa nʼotu ebe obibi gaa ebe nke ọzọ.
6 Wherever I moved with all Israel, did I ever speak a word to any of Israel's judges, whom I commanded to shepherd my people, asking, 'Why haven't you built me a cedar house?' Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ndu ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’
7 So tell my servant David: "This is what the Father of heaven's armies says: I took you from the pasture, from following the flock, to be ruler over my people Israel. “Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị, mee gị onye na-achị ndị m Izrel.
8 I've been with you everywhere you went, and cut off all your enemies before you. Now I'll make your name like the name of earth's greatest ones. Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.
9 I will appoint a place for my people Israel and plant them there, to live in their own home, never disturbed again. Wicked people will no longer wear them down as before, Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,
10 since I appointed judges over my people Israel, I will subdue all your enemies. I tell you: your Father will build you a house. dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m eme ka ndị iro gị niile nọrọ nʼokpuru gị. “ ‘Ana m ekwupụtara gị na Onyenwe anyị ga-ewuru gị ụlọ.
11 When your days end and you go to be with your ancestors, I will raise your offspring after you, one of your sons, and I will establish his kingdom. Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.
12 He is the one who will build me a house, and I will establish his throne forever. Ọ bụ ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ, aga m emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
13 I will be his Father; he will be my son. I won't remove my covenant love from him as I removed it from the one before you. Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna, ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Agaghị m ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m mere onye bu gị ụzọ chịa.
14 I will set him over my house and my kingdom forever; his throne will stand firm forever." Aga m eme ka ọ chịa ụlọ m na nʼalaeze m ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emekwa ka ocheeze ya bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
15 Nathan reported to David all these words and this entire vision. Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.
16 Then King David went in, sat before our Father, and said, "Who am I, my Father, and what is my house, that you have brought me this far? Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onyenwe anyị Chineke, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a?
17 And as if this were a small thing in your eyes, my Father—you have spoken of your servant's house reaching into the distant future, and you have looked on me as the greatest of men, my Father. O Chineke m, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị, ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị. Ma gị onwe gị Onyenwe anyị Chineke na-ele m anya dịka a ga-asị na m bụ onye ọnọdụ ya dị elu karịchasịa nke ụmụ mmadụ niile.
18 What more can David say to you for honoring your servant? For you know your servant. “Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma,
19 My Father, for your servant's sake and by your own heart, you have done all these great things, revealing all these great promises. O Onyenwe anyị, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu.
20 My Father, none is like you, no Father besides you, as all we've heard with our ears. “Onyenwe anyị, ọ dịghị onye dịka gị, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.
21 Who is like your people Israel, the one nation on earth our Father went to redeem as a people for himself, making yourself a name by great and awesome deeds, driving out nations before your people, whom you redeemed from Egypt? Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa ndị Chineke ha gara ịgbapụtara onwe ya ka ọ bụrụ otu ndị, na iji mere onwe gị aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?
22 You made your people Israel your very own forever, and you, my Father, became their Father. I mere ka ndị gị Izrel bụrụ ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.
23 Now, my Father, let the word you spoke about your servant and his house stand forever; do as you have spoken. “Ma ugbu a, Onyenwe anyị, mee ka nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya bụrụ nke ga-eguzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị,
24 Let it stand, and your name grow great forever, so it's said, 'The Father of heaven's armies is our Father over Israel.' Let your servant David's house be established before you. ka o nwee ike guzosie ike. Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke na-achị Izrel, bụ Chineke Izrel.’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị Devid guzosie ike nʼihu gị.
25 For you, my Father, revealed to your servant that you will build him a house—so your servant found courage to pray before you. “Gị onwe gị, Chineke m, e kpugheerela ohu gị na ị ga-ewuru ya ụlọ. Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere.
26 Now, my Father, you are our Father; you promised your servant this good thing. Gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Chineke. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a.
27 Now you have chosen to bless your servant's house, so it may continue before you forever; for you, my Father, have blessed it, and it is blessed forever." Ugbu a, ọ masịrị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ime ka ọ dịrị na-aga nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi na gị Onyenwe anyị, agọziela ya. Ọ ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]